Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 23 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Jenụwarị 2027

Satọdee · Izu nke 2 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 2 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 9:2–3, 11–14

2E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ. 3Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ, 11Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke, 12o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi. 13Ma ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oke ehi dị iche iche, ya na ntụ nwa agbọghọ ehi, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ido ha nsọ, meekwa ka ha dị ọcha nʼelu ahụ. 14Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 47:1–2, 5–8

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke. 2Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile. 5Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo. 6Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto. 7Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya. 8Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.

Oziọma

Mak 3:20–21

20Emesịa, ọ lọtara nʼụlọ, ma igwe mmadụ gbakọtakwara ọzọ nke mere na ha enweghị ohere iri nri. 21Mgbe ndị ikwu ya nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nʼụlọ ha, nʼihi na ndị mmadụ na-asị, “Isi adịghị ya mma.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike