Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 25 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Jenụwarị 2027

Mọnde · Izu nke 3 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Ntụgharị obi nke Onye nsọ Pọl Onyeozi

Mmemme · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 22:3–16

ma ọ bụ: Ọrụ 9:1–22

3“Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nʼime Silisia. Azụrụ m na obodo a nʼụkwụ Gamaliel onye nkuzi m. Anatara m ọzụzụ dị ike na ịsọpụrụ iwu nke nna nna anyị ha ejikwa m ịnụ ọkụ nʼobi na-efe Chineke dịka unu niile si eme taa. 4Akpagburu m ndị niile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nʼaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nʼụlọ mkpọrọ. 5Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ. 6“Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m. 7Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’ 8“ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ. “Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’ 9Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu. 10“Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’ 11Nʼihi na-enweghị m ike ịhụ ụzọ nʼihi ebube ìhè ahụ chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nʼaka bata na Damaskọs. 12“Nʼebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị mma site nʼọnụ ndị Juu bi nʼebe ahụ. 13Ọ bịakwutere m, guzoro nʼakụkụ m sị, ‘Nwanna anyị Sọl, ka emee ka ị hụ ụzọ!’ Otu mgbe ahụ, e nwetara m ike ịhụ ụzọ, m hụkwara ya. 14“Mgbe ahụ, ọ sịrị, ‘Chineke nke nna nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye Ezi Omume ahụ na ịnụta okwu site nʼọnụ ya. 15Ị ga-abụ onyeama ya nye ndị niile banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ. 16Ma ugbu a, gịnị ka ị na-eche? Bilie ọtọ, ka e mee gị baptizim, ka a sachakwa gị site na mmehie, na-akpọkukwa aha ya.’

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 117:1–2

1Toonu Onyenwe anyị, unu mba niile dị iche iche. Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche. 2Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu. Ikwesi ntụkwasị obi Onyenwe anyị na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị!

Oziọma

Mak 16:15–18

15Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma. 16Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe. 17Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche. 18Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike