Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 24 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 11 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Jenụwarị 2027
Sọnde · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 34 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Sọnde mgbe Teofani gasịrị
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 1
16Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa. 17Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ. 18Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m. 19Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. 20Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”
Akwụkwọ ozi (maka Sọnde mgbe Teofani gasịrị)
7Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kraịst siri dị. 8Nʼihi nke a, e kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nʼelu, o duuru igwe ndị a dọtara nʼagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye dị iche iche.” 9(E kwuru, “Ọ rigoro,” gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buru ụzọ rịdaa nʼime ala mmụọ? 10Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.) 11O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi. 12Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst; 13tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Teodosiọs)
6Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst. 7Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị. 8A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba. 9A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi. 10Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị. 11Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ. 12Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu. 13Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu, 14ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya. 15Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.
Oziọma (maka Sọnde mgbe Teofani gasịrị)
12Mgbe Jisọs nụrụ na e tinyela Jọn nʼụlọ mkpọrọ, ọ pụrụ gaa Galili. 13Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm, bụ obodo dị nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nʼoke ala Zebụlọn na Naftalị. 14Nʼụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sịrị, 15“Ala Zebụlọn na ala Naftalị, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ, 16ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.” 17Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”
Oziọma (maka Onye nsọ Teodosiọs)
27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 24 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike