Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 23 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 10 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Jenụwarị 2027
Satọdee · Izu nke 34 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee mgbe Teofani gasịrị
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi (maka Satọdee mgbe Teofani gasịrị)
10Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu. 11Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu. 12Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe. 13Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ. 14Meenụ ka eziokwu dịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike, ezi omume bụrụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu. 15Werenụ njikere nke ikwusa oziọma nke udo yikwasị dị ka akpụkpọ nʼụkwụ unu. 16Mgbe niile, unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ àkụ niile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nʼebe unu nọ. 17Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.
Akwụkwọ ozi
11Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na “ndị e biri ugwu” na-akpọkwa unu “ndị a na-ebighị ugwu” (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie). 12Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa. 13Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri.
Oziọma (maka Satọdee mgbe Teofani gasịrị)
1Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. 2Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. 3Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” 4Ma Jisọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’ ” 5Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu, 6sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’” 7Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’ ” 8Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha. 9Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.” 10Ma Jisọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ” 11Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi.
Oziọma
18Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? 19O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.” 20Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke? 21Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.” 22O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem. 23Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha, 24“Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. 25Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’ 26“Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’ 27“Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’ 28“Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi. 29Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 23 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike