Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 22 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 9 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Jenụwarị 2027

Fraịdee · Izu nke 34 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Theophany

Ụbọchị obubu ọnụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Hib 7:18–25

18Nʼotu aka ahụ, e wezugala usoro iwu ochie ahụ nʼihi adịghị ike ya na nʼihi abaghị uru ya 19(nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso. 20Ma e ji ịṅụ iyi mee ka ọnọdụ onyeisi nchụaja a guzosie ike. O nweghị iyi a ṅụrụ mgbe ndị ọzọ ghọrọ ndị nchụaja. 21Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’ ” 22Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma. 23Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha. 24Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile. 25Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha.

Oziọma

Luk 21:37–22:8

37Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị. 38Ndị mmadụ niile na-abịakwute ya nʼisi ụtụtụ niile nʼụlọnsọ ukwu ịnụrụ okwu ya. 22:1Nʼoge a, Mmemme Achịcha na-ekoghị eko nke a na-akpọ Ngabiga na-eru nso. 2Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, nʼihi na ha na-atụ egwu ndị mmadụ. 3Mgbe ahụ, ekwensu banyere nʼime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya. 4Ọ gakwuru ndịisi nchụaja, na ndịisi ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ya na ha akparịta ụka otu ọ ga-esi rara ya nyefee ya nʼaka ha. 5Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kwekwa nkwa inye ya ego. 6O kwenyere, na-achọkwa ohere ga-adị mma ọ ga-eji nyefee ya nʼaka ha mgbe igwe mmadụ na-agaghị anọ. 7O ruo nʼụbọchị Mmemme Achịcha na-ekoghị eko ahụ bụ ụbọchị a na-eji atụrụ Ngabiga achụ aja. 8O zipụrụ Pita na Jọn sị, “Gaanụ kwadoo maka oriri Ngabiga nke anyị ga-eri.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 22 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike