Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 17 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Jenụwarị 2027
Sọnde · Izu nke 2 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 2 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
3Mgbe ahụ, oriọna Chineke anyụbeghị, Samuel dinara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼebe ahụkwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị. 4Onyenwe anyị kpọrọ Samuel oku, Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.” 5O biliri jekwuru Elayị, sị ya, “Lee m abịala m.” Ma Elayị sịrị ya, “Mba, akpọghị m gị, laghachi gaa dinaa ala.” Samuel gara dina ala. 6Ọzọkwa, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị, “Samuel!” Samuel gbaara ọsọ jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka m ga-eme?” Ma Elayị zara sị ya. “Mba akpọghị m gị oku, nwa m. Laghachi gaa dinaa ala.” 7Ma Samuel amatabeghị onye Onyenwe anyị bụ, ekpughebeghị okwu Onyenwe anyị nye ya. 8Onyenwe anyị kpọrọ ya oku nke ugbo atọ; ọzọkwa Samuel biliri jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” Mgbe ahụ, Elayị ghọtara na ọ bụ Onyenwe anyị na-akpọ nwantakịrị ahụ, 9nʼihi ya ọ gwara Samuel okwu sị, “Laghachi, dinaa ala. Ọ bụrụ na ọ kpọọ gị ọzọ, sị ya, ‘Lee m, kwuo, Onyenwe anyị, nʼihi na ohu gị na-ege ntị.’ ” Ya mere Samuel laghachiri gaa dinaa ala. 10Onyenwe anyị bịara guzo onwe ya nʼebe ahụ, kpọọ ya ọzọ dịka o si kpọọ ya na mbụ sị, “Samuel! Samuel!” Samuel zara sị, “Lee m, kwuo, nʼihi na ohu gị na-anụ.” 19Onyenwe anyị nọnyeere Samuel mgbe ọ na-eto, meekwa ka amụma niile Samuel buru mezuo.
Abụ Ọma nzaghachi
2O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo. 3O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị. 6Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. 7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. 8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.” 9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o Onyenwe anyị, anaghị m emechi ọnụ m.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
13Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị. 14Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie. 15Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa! 17Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ. 18Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya. 19Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke. 20E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.
Oziọma
35Nʼechi ya, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya guzoro nʼebe ahụ ọzọ. 36Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe, ọ sịrị, “Leenụ, Nwa Atụrụ Chineke.” 37Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha tụgharịrị soro Jisọs. 38Mgbe Jisọs tụgharịrị hụ ka ha na-eso ya, ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ?” Ha sịrị ya, “Rabbi” (nke pụtara “Onye ozizi”), “olee ebe i bi?” 39Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.” Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede. 40Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita. 41Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst). 42Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Antoni nke Ijipt, Onyeisi ndị mọnk
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike