Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 14 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 1 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Jenụwarị 2027
Tọọzdee · Izu nke 33 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Circumcision of our Lord
Oge Krismas (Svyatki)
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Mgbe Ebram gbara iri afọ itoolu na itoolu, Onyenwe anyị gosiri ya onwe ya sị ya, “Abụ m Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Jegharịa ije nʼihu m, bụrụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla. 2Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị nʼetiti mụ na gị, mekwa ka ị mụbaa nke ukwuu nʼọnụọgụgụ.” 4“Lee, nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị. Ị ga-abụ nna ọtụtụ mba. 5Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba. 6Aga m eme gị ka ị mụbaa nke ukwuu. Aga m eme ka ị ghọọ ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esitekwa na gị pụta. 7Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị gbara guzosie ike, ka ọ dịkwara ụmụ ụmụ ndị ga-esote gị nʼọgbọ niile na-abịa. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-egosi na m bụ Chineke gị, na Chineke ụmụ ụmụ gị niile ga-eso gị. 8Ala Kenan niile, ebe ị nọ ugbu a dịka ọbịa ka m ga-enye gị na ụmụ ụmụ gị ga-esote gị dịka ihe nketa ebighị ebi. Aga m abụ Chineke ha.” 9Chineke gwara Ebraham okwu sị ya, “Ma nʼebe ị nọ, ị ghaghị irube isi imezu ihe ọgbụgba ndụ m kwuru, gị onwe gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ruo ọgbọ niile. 10Nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ọgbụgba ndụ nke unu na-aghaghị idebe. A ga-ebi nwoke ọbụla nʼetiti unu ugwu. 11A ga-ebi unu ugwu, bipụ elu ahụ nke anụ ahụ unu. Nke a ga-abụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na unu. 12Nʼoge ọ gbara mkpụrụ ụbọchị asatọ, unu ga-ebi nwoke ọbụla nʼagbụrụ unu ugwu: ndị a mụrụ nʼụlọ, maọbụ ndị eji ego zụta site nʼaka ndị mba ọzọ, ndị na-esighị na mkpụrụ nke afọ gị. 14Nwoke ọbụla a na-ebighị ugwu nke anụ ahụ ka a ga-ebipụ site nʼetiti ụmụnna ya. Nʼihi na o mehiela megide ọgbụgba ndụ m.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
22“ Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ. 23Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa. 24Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa, 25tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta. 26E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya. 27Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile; 28mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike, 29mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa. 30Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
31Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu. 32Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie. 11:1Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ. 2Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe. 3Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi. 4Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ. 5Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha. 6Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha. 7Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi. 8Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya. 9Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya. 10Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ. 11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume. 12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri. 10Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke. 11“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya. 12Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha. 13Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ. 14“Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m. 15Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ. 16Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.
Akwụkwọ ozi (maka obibi úgwù nke Onyenwe anyị)
8Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iji ozizi na amamihe efu niile nke na-achị ụwa, na aghụghọ duhie unu nʼokwukwe. Okwu amamihe ahụ nke ihe ozizi ya na ọsịsa ya niile dabeere na mmụọ nke ụwa na ntụpụta mmadụ kama ịdabere nʼihe Kraịst kwuru. 9Nʼihi na nʼime Kraịst ka izuoke niile nke Chineke bi nʼụdịdị mmadụ. 10Ya mere, unu nwere ihe niile nʼime ya, onye bụ isi ndị niile na-achị achị, onye bụkwa isi nʼebe ike na ịchị isi niile dị. 11Nʼime ya, e biri unu ugwu nke ejighị aka bie, site nʼiwepụ ọdịdị anụ ahụ nʼobibi ugwu nke Kraịst biri. 12Mgbe e likọtara unu na ya na baptizim, e sitere nʼọnwụ kpọlite unu na ya site nʼokwukwe ahụ dị nʼike Chineke onye sitere nʼọnwụ kpọlite ya.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Basil)
26Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe. 27Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja. 28Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi. 8:1Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe. 2Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya.
Oziọma (maka obibi úgwù nke Onyenwe anyị)
20Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha. 21Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, mgbe oge ruru ibi nwata ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi nyere tupu a dị ime ya. 40Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya. 41Nʼafọ niile, ndị mụrụ ya na-aga Jerusalem nʼihi Mmemme Ngabiga. 42Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị. 43Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta. 44Ha chere na o sonyere nʼetiti njem. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha a malite ịchọ ya nʼetiti ndị ikwu na ibe, na ndị enyi ha. 45Ma mgbe ha na-ahụghị ya, ha laghachiri Jerusalem na-achọkwa ya. 46Ka ụbọchị atọ gasịrị, ha hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ebe ọ nọdụrụ nʼetiti ndị ode akwụkwọ, na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ. 47Nghọta na ọsịsa ya juru ndị niile nụrụ okwu ya anya. 48Mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha nʼanya, ma nne ya sịrị ya, “Nwa m, gịnị mere i ji mesoo anyị mmeso dị otu a? Mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị?” 49Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-achọ m? Unu amaghị na aghaghị m ịnọ nʼụlọ Nna m?” 50Ma ha aghọtaghị ihe ọ gwara ha. 51Mgbe ahụ, o sooro ha laghachi Nazaret ma na-erubekwara ha isi. Ma nne ya dobere ihe ndị a niile nʼobi ya. 52Jisọs na-aga nʼihu nʼamamihe na ogologo, ya na ihuọma nʼebe Chineke na nke mmadụ nọ.
Oziọma (maka Onye nsọ Basil)
17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 14 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike