Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 13 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 31 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Jenụwarị 2027
Wenezdee · Izu nke 33 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Apodosis of the Nativity of Christ
Oge Krismas (Svyatki)
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
9Gbalịsie ike ịbịakwute m ọsịịsọ, 10nʼihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nʼanya ahapụla m gaa Tesalonaịka. Kresens agaala Galeshịa, Taịtọs agakwaala Dalmetia. 11Ọ bụ naanị Luk nọnyere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nʼihi na ọ ga-enyere m aka nʼije ozi m. 12Ezipụla m Taịkikọs ka ọ gaa Efesọs. 13Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ nʼaka Kapọs na Troas, wetakwara m akwụkwọ m niile ahụ dị nʼebe ahụ, ọkachasị akwụkwọ akpụkpọ anụ niile ahụ. 14Alegzanda onye na-akpụ ọla emeela m ọtụtụ ihe ọjọọ. Onyenwe anyị ga-akwụghachi ya dị ka ihe o mere m si dị. 15Kpachara anya nʼebe ọ nọ, nʼihi na o guzosiri ike megide ihe niile anyị kwuru. 16Na mbụ, mgbe m pụtara ikpere ọnụ m, ọ dịghị onye kwụnyeere m. Ha niile gbahapụrụ m. Ka a hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie. 17Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm. 18Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 19Keleere m Prisila na Akwila na ndị niile bi nʼụlọ Onisiferọs. 20Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Melitọs nʼọnọdụ ahụ esighị ike. 21Jisie ike bịarute nʼebe a tupu oge oyi eruo. Yubulọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainọs na Klọdia na ụmụnna anyị niile. 22Ka Onyenwe anyị nọnyere mmụọ gị. Ka amara dịnyere gị.
Oziọma
23Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa. 24Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu. 25Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu. 26Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbagharakwa unu mmehie unu.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 31 Disemba na kalenda nzukọ bụ 13 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike