Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 14 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Jenụwarị 2027

Tọọzdee · Izu nke 1 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 1 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 3:7–14

7Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa, 8unu emela ka obi unu sie ike, dị ka unu mere nʼoge nnupu isi mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara, 9ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa. Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a. 10Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ. Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile. Ha amatabeghị ụzọ m niile.’ 11Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” 12Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa. 13Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike. 14Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 95:6–11

6Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị; 7nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, 8“Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara, 9ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere. 10Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ; ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ, ha amatabeghị ụzọ m niile.’ 11Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”

Oziọma

Mak 1:40–45

40Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” 41Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!” 42Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha. 43Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya, 44ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.” 45Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike