Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 21 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Novemba 2026

Satọdee · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Nchụ Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi nʼụlọnsọ · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Mkp 11:4–12

4Ndị a bụ osisi oliv abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ, ndị na-eguzo nʼihu Onye nwe ụwa. 5Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, ọkụ ga-esi ha nʼọnụ pụta rechapụ ndị iro ha. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, a ga-egbu ya nʼụzọ dị otu a. 6A ga-enyekwa ha ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzo ọbụla ghara izo nʼụwa nʼime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta niile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa niile nʼoge ọbụla ha chepụtara nʼobi ha. 7Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha. 8Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọrọ nʼokporoụzọ nke obodo ukwu ahụ nke a na-akpọ na mmụọ Sọdọm na Ijipt, ebe a kpọgburu Onyenwe ha nʼobe. 9A gaghị ekwenyekwa ka onye ọbụla lie ozu ha. Ma ndị niile dị iche iche nʼụwa, nʼebo niile, na asụsụ niile, na mba niile ga-agba ozu ha gburugburu ụbọchị atọ na ọkara nʼebe a tọgbọrọ ha na-ele ha anya. 10Ndị niile bi nʼụwa ga-aṅụrị ọṅụ, nyerịta ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nʼihi ogbugbu e gburu ndị amụma abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhụju anya. 11Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nʼime ha, ha bilitere ọtọ, oke egwu jidere ndị niile hụrụ ha. 12Ha nụrụ oke olu si nʼeluigwe daa na-asị, “rigotanụ nʼelu.” Ha siri nʼigwe ojii, rigoro nʼeluigwe ebe ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 144:1–2, 9–10

1Abụ Ọma nke Devid. Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m, onye na-ezi aka m abụọ ibu agha, na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ. 2Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m, ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya, onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m. 9O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu; 10gị onye na-enye ndị eze mmeri, onye na-agbapụta ohu ya Devid. Site na mma agha dị njọ

Oziọma

Luk 20:27–40

27Ụfọdụ ndị Sadusii, ndị sị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya 28ma jụọ ya sị, “Onye ozizi, Mosis deere anyị na ọ bụrụ na nwanne nwoke mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwoke dị otu a ga-alụrụ nwunye nwanne ya nwoke ahụ, sị otu a, mụtara nwanne ya ụmụ. 29Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, onye nke mbụ lụrụ nwanyị, nwụọ na-amụtaghị nwa. 30Nke abụọ kwa 31na onye nke atọ lụrụkwara ya. Nʼotu aka ahụ ha asaa lụchara ya ma nwụọ na-amụtaghị nwa. 32Nʼikpeazụ nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 33Ya mere, nʼoge mbilite nʼọnwụ nwunye onye ka ọ ga-abụ? Nʼihi na ha asaa lụchara ya?” 34Jisọs gwara ha, “Ndị nke ọgbọ a na-alụ nwunye, ma na-enyekwa ụmụ ha ka a lụrụ ha. 35Ma ndị ahụ a gụrụ dị ka ndị kwesiri isoro keta oke nʼọgbọ ahụ, nakwa na mbilite nʼọnwụ agaghị alụ di na nwunye. 36Nʼezie, ha apụghịkwa ịnwụ ọzọ, nʼihi na ha dị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke, nʼihi na ha bụ ụmụ nke mbilite nʼọnwụ. 37Ọ bụladị Mosis nʼonwe ya zipụtara na mbilite nʼọnwụ dị, nʼakụkọ banyere ọhịa ahụ na-ere ọkụ, mgbe ọ na-akpọ Onyenwe anyị ‘Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.’ 38Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, nʼihi nʼebe ọ nọ mmadụ niile dị ndụ.” 39Ụfọdụ ndị ozizi iwu zara ya sị, “Onye ozizi, ị kwuru nke ọma.” 40O nwekwaghị onye ọbụla jụrụ ya ajụjụ ọzọ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike