Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 21 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 8 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 21 Novemba 2026
Satọdee · Izu nke 25 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Synaxis of the Chief of the Heavenly Hosts, Archangel Michael and the Other Heavenly Bodiless Powers: Archangels Gabriel, Raphael, Uriel, Selaphiel, Jehudiel, Barachiel, and Jeremiel
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
13Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị?” 14Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” 15Ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị zara sị Joshua, “Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.” Joshua mere dịka ọ gwara ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
2Nʼihi na ndị Midia mekpara ha ahụ nke ukwuu, ụmụ Izrel meere onwe ha ebe obibi nʼugwu, nʼime ọgba nkume, na nʼebe e wusiri ike dị iche iche. 7Mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị nʼihi mkpagbu ndị Midia na-akpagbu ha, 11Mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara nọdụ ọdụ nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼOfra, nʼala ubi Joash, onye obodo Abieza, ebe nwa ya a na-akpọ Gidiọn nọ na-azọcha mkpụrụ ọka wiiti nʼime ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼihi na ọ na-ezo onwe ya ka ndị Midia hapụ ịhụ ya anya. 12Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụtara ihe nʼebe ahụ gwa ya okwu sị, “Gị dike na dimkpa nʼagha, Onyenwe anyị nọnyeere gị.” 13Gidiọn zara sị, “Biko onyenwe m, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji na-adakwasị anyị? Ebeekwanụ ka ihe ịrịbama ahụ niile dị nke nna anyị ha gwara anyị sị, ‘Ọ bụghị site nʼIjipt ka Onyenwe anyị siri gbapụta anyị?’ Ma ugbu a, Onyenwe anyị ajụla anyị, hapụ anyị nʼaka ndị Midia ka ha laa anyị nʼiyi.” 14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.” 15Ma Gidiọn sịrị ya, “Biko, Onyenwe m, olee otu m ga-esi zọpụta Izrel? Lee, esi m nʼikwu dịkarịsịrị nta nʼime Manase pụta. Mụ onwe m bụkwa onye dịkarịsịrị ala nʼezinaụlọ m.” 16Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Mụ onwe m ga-anọnyere gị. Ị ga-ebibikwa ndị Midia niile.” 17Gidiọn zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nye m ihe ịrịbama nke ga-egosi na ọ bụ gị nʼezie na-agwa m okwu. 18Biko esikwala ebe a pụọ ruo mgbe m lọghachiri weta onyinye m ga-eche nʼihu gị.” Onyenwe anyị zara sị ya, “Aga m eche ruo mgbe ị lọghachiri.” 19Gidiọn mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, gbuo otu nwa ewu, sie ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha, nke ihe na-eko achịcha na-adịghị nʼime ya. Emesịa, o tinyere anụ ahụ nʼime nkata, wụnyekwa ofe nʼime ite, buru ha jekwuru Mmụọ ozi ahụ, ebe ọ nọ na-eche ya nʼokpuru osisi ook ahụ. 20Mmụọ ozi nke Chineke sịrị ya, “Were anụ a na ogbe achịcha ahụ na-ekoghị eko, tụkwasị ha nʼelu nkume a, wụpụkwa ofe ahụ.” Gidiọn mere otu a. 21Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ metụrụ ọnụ mkpanaka ahụ nke dị nʼaka ya nʼelu anụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko. Ọkụ sitere nʼoke nkume ahụ nwuru, rechapụ anụ ahụ na achịcha nʼekoghị eko ahụ. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị ahụ gbara barịị site nʼihu ya. 22Mgbe Gidiọn ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, o tiri mkpu akwa sị, “Ewoo! Onyenwe m Onyenwe anyị! Ahụla m Mmụọ ozi Onyenwe anyị ihu na ihu!” 23Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Udo dịrị gị, atụla egwu! Ị gaghị anwụ.” 24Ya mere, Gidiọn wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, kpọọ ya, Onyenwe anyị bụ Onye Udo. Ụlọ nchụaja ahụ dịkwa nʼime obodo Ofra nʼala ndị Abieza ruo taa.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
7Ụwa niile adaala jụ, ha enwekwaala izuike, ha na-etipụ olu ịbụ abụ. 8Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị, “Agbajiela ike gị; ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.” 9Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche. 10Ha niile ga-eji otu olu zaa, ha ga-asị gị, “Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike; Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.” 11Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị. 12Lee ka i si site nʼeluigwe daa, gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ. Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ, ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala. 13Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị, “Aga m arịgoro nʼeluigwe, doo ocheeze m nʼelu kpakpando niile Chineke kere; aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ, na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu. 14Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.” 15Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ. 16Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya, na-atule banyere ndụ gị, sị, “Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji, onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ. 17Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara? Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile, jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?” 18Ndị eze mba niile dị iche iche na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha. 19Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ. 20A gaghị eli gị dịka e si lie ndị eze ndị ọzọ, nʼihi na i bibiela ala gị. I gbukwaala ndị gị. A gaghị akpọtụkwa aha ụmụ ụmụ ndị na-emebi iwu ọzọ.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
24Ọ tụụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka mmadụ ọbụla nke kụrụ ezi mkpụrụ nʼubi ya. 25Ma nʼotu abalị, mgbe onye ọbụla nọ nʼụra, onye iro gara nʼubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nʼetiti ezi mkpụrụ ọka wiiti ahụ ọ kụrụ ma laa. 26Mgbe mkpụrụ ọka wiiti ndị ahụ puputara, mepụta isi ọka, ahịhịa ahụ bidokwara ito. 27“Ndị ọrụ onye nwe ubi ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ nʼubi gị? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’ 28“Onye ọrụ ubi ahụ zara ha sị, ‘Ọ bụ onye iro m kụrụ ahịhịa ndị a.’ “Ndị ọrụ ya jụrụ ya sị, ‘Ị chọrọ ka anyị gaa fopụtasịa ha?’ 29“Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, ‘Ọ dịghị, nʼihi na mgbe unu na-achọ ihopu ahịhịa ndị ahụ, unu nwere ike site na-amaghị ama hopu ezi mkpụrụ ọka wiiti. 30Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ na-etokọta, tutu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nʼoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunu ụzọ chịkọtasịa ahịhịa ndị a niile, kee ha nʼukwu nʼukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpokọtanụ ọka wiiti ndị a tinye ha nʼọba m.’ ” 36Emesịa, ọ hapụrụ igwe mmadụ ahụ baa nʼụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nʼubi a kụrụ ọka.” 37Jisọs zara ha sị, “Nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke Mmadụ. 38Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nʼubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nʼubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ajọ onye ahụ. 39Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi. 40“Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. 41Nwa nke Mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa site nʼalaeze ya fopụtasịa ihe niile na-eme ka e mee mmehie, na ndị niile na-eme ajọ ihe. 42Ha ga-atụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze. 43Ma ndị niile bụ ndị ezi omume ga-enwu dị ka anyanwụ nʼime alaeze Nna ha. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
Akwụkwọ ozi (maka ndị mmụọ ozi)
2Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya. 3Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya. 4Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị. 5Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa. 6Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya? 7Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze, 8dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya. 9Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile. 10Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ.
Oziọma (maka ndị mmụọ ozi)
16“Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.” 17Iri mmadụ asaa na abụọ ahụ jiri ọṅụ lọta sị, “Onyenwe anyị, nʼaha gị, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi.” 18Ọ sịrị ha, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nʼeluigwe daa dị ka amụma. 19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.” 21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 8 Novemba na kalenda nzukọ bụ 21 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike