Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 22 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Novemba 2026
Sọnde · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Eze nke Eluigwe na Ụwa
Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
11“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, mụ onwe m ga-eji aka m pụọ gaa chọgharịa igwe atụrụ m. Mụ onwe m kwa ga-elekọta ha. 12Dịka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta igwe ewu na atụrụ ya anya, mgbe ha na ya nọ, otu a ka m ga-esi lekọta igwe atụrụ m. Aga m anapụta ha site nʼebe niile ha gbasasịrị gaa, nʼụbọchị igwe ojii na ọchịchịrị ahụ. 15Ọ bụ mụ onwe m ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ m niile. Aga m eme ka ha makpuru nʼudo, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 16Aga m achọ ndị furu efu nʼime ha, ndị kpafuru akpafu, kpọghachite ha nʼụlọ. Aga m ekechi ọnya ndị merụrụ ahụ, meekwa ka ọ dị ike. Ma ndị mara abụba na nke ndị ahụ dị ike ka m ga-ala nʼiyi. Aga m eji ikpe ziri ezi zụọ ha. 17“ ‘Ma unu onwe unu, ụmụ igwe anụ ụlọ m, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m ekpe ikpe nʼetiti atụrụ na atụrụ, ebule na mkpi.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 3ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya. 5Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke. 6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
20Ma e mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie nʼezie, onye mbụ nʼetiti ndị niile nwụrụ anwụ. 21Nʼihi na dịka ọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa, otu a kwa ka mbilite nʼọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa. 22Dịka mmadụ niile si anwụ site nʼaka Adam, otu a kwa ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ nʼime Kraịst. 23Onye ọbụla ga-ebili nʼusoro nke ya, Kraịst mkpụrụ mbụ si nʼọnwụ bilie. Mgbe ọ lọghachiri, ndị niile bụ ndị nke Kraịst ga-esote. 24Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze nʼaka Chineke bụ Nna, nʼihi na o meriela ịchị isi niile, na ikike niile na ike niile. 25Nʼihi na ọ ga-abụ eze tutu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya. 26Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ. 28Mgbe e merela ka ihe niile nọrọ nʼokpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ya nʼonwe ya, ga-edobe onwe ya nʼokpuru onye ahụ dobere ihe niile nʼokpuru ya, ka Chineke bụrụ onye na-achị ihe niile.
Oziọma
31“Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. 32Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. 33Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya. 34“Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. 35Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m. 36Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’ 37“Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? 38Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe? 39Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’ 40“Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’ 41“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. 42Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. 43Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’ 44“Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’ 45“Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’ 46“Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Sesilia, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike