Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 20 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Novemba 2026

Fraịdee · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Mkp 10:8–11

8Olu nke ahụ m nụrụ mbụ sitere nʼeluigwe gwa m okwu ọzọ, na-asị, “Gaa nara mmụọ ozi ahụ guzo nʼelu oke osimiri na ala akọrọ, akwụkwọ ahụ aseghere aseghe nke o ji nʼaka ya.” 9Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ gwa ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ sịrị m, “Nara ya, taa ya. Ọ ga-eme ka afọ gị luo ilu, ma ‘nʼọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dịka mmanụ aṅụ.’” 10Ya mere, anaara m ya akwụkwọ nta ahụ site nʼaka mmụọ ozi ahụ taa ya. Ọ tọrọ ụtọ dịka mmanụ aṅụ nʼọnụ m, ma mgbe m lodara ya, afọ m bidoro ilu ilu. 11Mgbe ahụ ha sịrị m, “Ị ghaghị ibu amụma ọzọ banyere ọtụtụ mmadụ, na ọtụtụ mba, na ọtụtụ asụsụ na ọtụtụ ndị eze.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 119:14, 24, 72, 103, 111, 131

14Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba. 24Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m. 72Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. 103Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ! 111Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. 131Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike.

Oziọma

Luk 19:45–48

45Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu bido ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa. 46Ọ sị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ ‘na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere’; ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.’ ” 47Ụbọchị niile, ọ na-anọ na-akụzi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị ndu nʼetiti ndị mmadụ, nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. 48Ma ha achọtaghị ụzọ ọbụla ime ya, nʼihi na mmadụ niile sogidere ya kwenyekwara nʼokwu ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike