Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 8 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 26 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 8 Novemba 2026

Sọnde · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 23 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Aịz 63:15–64:5, 8–9

15Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe, ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya. Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị? Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa? 16Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị, a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị maọbụ Izrel agọnarị anyị, gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị, onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie. 17Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuo na-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị? Lọghachi nʼihi ndị ohu gị, nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị. 18Ọ bụ naanị nwa oge nta ka ndị gị nwetara ebe nsọ gị, ma ugbu a, ndị iro anyị azọdala ebe nsọ gị. 19Anyị bụ nke gị site na mgbe ochie, ma ị naghị achị nʼebe ha nọ, ha bụ ndị a na-akpọkwasịghịkwa aha gị. 64:1Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị! 2Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị. 3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị. 4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha. 5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị? 8Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite. Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile. 9Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe; echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Biko, lekwasị anyị anya nʼihi na ndị gị ka anyị bụ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jer 2:2–12

2“Gaa, kwupụta na ntị Jerusalem, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Echetara m ịnụ ọkụ nʼobi nke okorobịa gị nʼoge gara aga ime ihe ga-atọ m ụtọ, ịhụnanya gị dịka onye a lụrụ ọhụrụ, echetakwara m otu unu si soro m nʼime ọzara, ga nʼala tọgbọrọ nʼefu nke a na-akụghị mkpụrụ. 3Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị, mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya. Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara. Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 4Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb, na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel. 5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m, mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya? Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu site nʼịgbaso arụsị? 6Ha ajụghị ‘Olee ebe Onyenwe anyị ahụ nọ, bụ onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta anyị, duuru anyị gafee ọzara tọgbọrọ nʼefu, nʼala ọzara na ala olulu jupụtara, ala nke akpịrị ịkpọ nkụ na nke oke ọchịchịrị, ala ebe ọ dịghị onye na-esi na ya agafee na nke mmadụ na-ebighị na ya?’ 7Ọ bụ m kpọbatara unu nʼala na-amị ọtụtụ mkpụrụ, ka unu rie ihe dị ukwuu na ihe dị mma si nʼime ya. Ma unu bara merụọ ala m unu mere ihe nketa m ka ọ ghọọ ihe arụ. 8Ndị nchụaja ajụghị sị, ‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’ Ndị ikpe ha amaghị m, ndị na-achị ha mehiere megide m, ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma, ha gbasooro ihe na-enweghị isi. 9“Nʼihi ya, aga m ebulite ebubo megide unu,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-ebulikwa ebubo megide ụmụ ụmụ unu. 10Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya, zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma, ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a. 11O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe? (Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.) Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi gbanwere ebube ha. 12Ka ibubo nwụọ gị, gị eluigwe nʼihi nke a, maa jijiji, tụọkwa oke ụjọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 1

Mat 28:16–20

16Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa. 17Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ. 18Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m. 19Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. 20Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”

Akwụkwọ ozi

Efe 2:4–10

4Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ, 5mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu. 6Ọ kpọlitere anyị na ya, mee ka anyị nọdụ ọdụ nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst Jisọs. 7O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs. 8Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke. 9O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi. 10Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.

Akwụkwọ ozi (maka ala ọma jijiji)

Hib 12:6–13, 25–27

6Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.” 7Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. 8Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko. 9Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ. 10Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya. 11Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, ọ bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, ọ na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya. 12Ya mere, setịpụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzosie ike nʼụkwụ gị ahụ na-ama jijiji. 13Debenụ ụkwụ unu nʼụzọ ziri ezi, ka ụkwụ na-adịghị ike ghara ịda ngwụrọ, kama ka o nwe ọgwụgwọ. 25Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị. 26Nʼoge ahụ, olu ya mere ka ụwa ma jijiji, ma ugbu a, ọ kwela nkwa, sị, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ, ọ bụghị naanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.” 27Okwu a bụ, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ,” na-egosi mwepụ nke ihe na-ama jijiji dịka ihe e kere eke, iji hụ na nke na-anaghị ama jijiji ga-adị.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Dimitriọs)

2Tm 2:1–10

1Ya mere, nwa m, bụrụ onye dị ike site nʼamara ahụ Kraịst Jisọs na-enye. 2Ihe niile nke ị nụrụ nʼọnụ m nʼihu ọtụtụ ndị ama ka ị ga-enyefe nʼaka ndị kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a. 3Soro m kere oke nʼahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst. 4Ọ dịghị onye agha ọbụla na-ekekọta onwe ya nʼihe nke ụwa a, kama ọ na-achọ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ. 5Otu aka ahụ, onye na-agba ọsọ agaghị enweta okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị ọsọ ya dịka usoro iwu ịgba ọsọ si dị. 6Onye ọrụ ubi na-adọgbu onwe ya nʼọrụ kwesiri ịbụ onye ga-ebu ụzọ rie mkpụrụ sitere nʼubi ya. 7Na-atụgharị uche nʼihe m kwuru, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta nʼime ha niile. 8Echefula Jisọs Kraịst, onye a kpọlitere site nʼọnwụ, onye sikwa nʼagbụrụ Devid, nke a bụ oziọma m. 9Ọ bụ nʼihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a dị ka onye ọjọọ, ma otu ọ dị, ekeghị okwu Chineke agbụ. 10Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi.

Oziọma

Luk 16:19–31

19“Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe odo odo na ezi akwa ọcha, na-erikwa nri dị mma ụbọchị niile. 20Nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, otu nwoke onye ogbenye nke ọnya juru ahụ ya na-edina nʼebe ahụ. Aha ya bụ Lazarọs. 21Ọ na-agụsị ya agụụ ike iri iberibe nri si na tebul ọgaranya ahụ daa nʼala. Ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nʼahụ. 22“Mgbe onye ogbenye ahụ nwụrụ, ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nʼebe Ebraham nọ. Onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya. 23Nʼọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nʼoke ihe mgbu, ọ hụrụ Ebraham ka ọ nọ nʼebe dị anya, hụkwa Lazarọs nʼakụkụ ya. 24Ọ kpọkuru Ebraham sị ya, ‘Nna m Ebraham, meere m ebere nʼihi na anọ m nʼoke ihe mgbu nʼime ọkụ a. Biko zienụ Lazarọs ka ọ denye mkpịsịaka ntakịrị ya na mmiri bịa mejụọ ire m.’ 25“Ma Ebraham sịrị ya, ‘Nwa m, chetakwa na ị nara ezi ihe gị mgbe ị dị ndụ, ebe Lazarọs nara ihe ọjọọ. Ma ugbu a, a na-akasị ya obi nʼebe a ma gị onwe gị nọkwa nʼahụhụ. 26A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nʼihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike isite nʼebe a bịa nʼebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nʼebe ahụ unu nọ bịa nʼebe a.’ 27“Ọ sịrị, ‘Ya mere, arịọ m gị nna, ziganụ ya nʼụlọ nna m, 28nʼihi na enwere m ụmụnne nwoke ise. Ka ọ dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịbịa nʼebe a mmekpa ahụ dị.’ 29“Ebraham sịrị, ‘Ha nwere Mosis na ndị amụma, ha gee ha ntị.’ 30“Ma o kwuru, ‘Nna Ebraham, nke ahụ agaghị ezu! A sị na otu onye ga-esi nʼala ndị nwụrụ anwụ gakwuru ha, ha ga-echegharị.’ 31“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụrụ na ha egeghị Mosis na ndị amụma ntị, ha agaghị ekwenye ma a sịkwarị na mmadụ esi nʼọnwụ bilie.’ ”

Oziọma (maka ala ọma jijiji)

Mat 8:23–27

23Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya. 24Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme. 25Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.” 26Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii. 27O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.”

Oziọma (maka Onye nsọ Dimitriọs)

Jọn 15:17–16:2

17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya. 18“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. 19A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. 20Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m. 22Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha. 23Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. 24A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. 25Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’ 26“Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite. 16:1“Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda. 2Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 26 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 8 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike