Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 9 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 27 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Novemba 2026

Mọnde · Izu nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Martyr Nestor of Thessalonica († c. 306)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 2:20–3:8

20Nʼezie, unu onwe unu bụ ọṅụ na otuto anyị. 3:1Ya mere, mgbe anyị na-apụghị ịnagide ya gaa nʼihu, anyị kpebiri ịnọ naanị anyị nʼAtens. 2Anyị zipụrụ Timoti, onye bụ nwanna anyị, onye anyị na ya so na-arụrụ Chineke ọrụ site nʼịkwusa oziọma Kraịst, ka ọ bịakwute unu, kasịe unu obi, meekwa ka unu guzosie ike nʼokwukwe unu. 3Ka unu hapụ ịda mba nʼihi mkpagbu ndị a a na-akpagbu unu. Ma ana m eche na unu onwe unu maara na nke a ga-abụ ihe nketa anyị. 4Nʼihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị buru ụzọ gbaara unu ama na ihe ndị a aghaghị ịbịakwasị unu. Ugbu a, ihe niile emezuola dị ka unu matakwara. 5Nʼihi nke a, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, eziri m ozi, ka a chọpụta maka okwukwe unu. Nʼihi na ụjọ m bụ ma eleghị anya o nweela ụzọ onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ si nwaa unu ọnwụnwa nʼoge a, mee ka ndọgbu niile anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ nʼetiti unu bụrụ ihe lara nʼiyi. 6Ma ugbu a, Timoti esitela nʼebe unu nọ lọghachikwute anyị. O wetara oziọma banyere okwukwe unu na ịhụnanya unu. O mekwara ka anyị mata na unu na-enwe ezi ncheta banyere anyị mgbe niile, na ọ na-agụsị unu agụụ ike ịhụ anyị anya, dị ka o si agụkwa anyị ịhụ unu anya. 7Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu. 8Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị.

Oziọma

Luk 10:22–24

22“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara onye Ọkpara ahụ bụ, karịa Nna ahụ. Ọ dịkwaghị onye maara Nna ahụ karịa Ọkpara na ndị ahụ Ọkpara chọrọ igosi onye Nna ya bụ.” 23Mgbe ahụ ọ tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzị na-adịrị anya nke na-ahụ ihe unu na-ahụ ugbu a. 24Ana m asị unu, na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 9 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike