Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 8 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Novemba 2026
Sọnde · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 32 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda. O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya. 2Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị. 3Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. 4Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. 5Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị. 6Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile. 7Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
13Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya. 14Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ. 15Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ. 16Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie. 17Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi. 18Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-agba onwe unu ume mgbe niile.
Oziọma
1“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. 2Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. 3Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. 4Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. 5Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra. 6“Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’ 7“Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha. 8Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’ 9“Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’ 10“Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ. 11“Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’ 12“Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’ 13“Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike