Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 31 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 18 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 31 Ọktoba 2026

Satọdee · Izu nke 22 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Holy Apostle and Evangelist Luke (1st C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

1Jọn 1:1–7

1Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị site na mmalite, nke anyị nụrụ, nke anyị jikwa anya anyị hụ, nke anyị lekwasịrị anya, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ. 2Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. 3Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ. 4Anyị na-edere unu ihe ndị a nʼihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke. 5Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya. 6Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị. 7Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jem 1:1–12

1Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara nʼelu ụwa niile akwụkwọ ozi a: Ndeewonụ! 2Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu. 3Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto. 4Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu. 5Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya. 6Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya. 7Onye dị otu ahụ ekwesighị ile anya na ọ ga-esite nʼaka Onyenwe anyị nata ihe ọbụla. 8Nʼihi na mmadụ dị otu a bụ onye ihu abụọ, onye na-adịghị eguzo nʼotu ebe nʼihe ọbụla ọ na-eme. 9Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ṅụrịa ọṅụ, mgbe ọbụla e weliri ya elu. 10Ka onye bụ ọgaranya mgbe a na-eme ka ọ nọdụ ya dị ala, nʼihi na ndị bara ụba ga-akpọnwụ dị ka okoko osisi. 11Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya. 12Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jud 1:1–7, 17–25

1Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a: 2Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba. 3Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe. 4Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe. 5Ọ bụ ezie na unu maa ihe ndị a niile, ma achọrọ m ichetara unu otu Onyenwe anyị si zọpụta ndị ya site nʼala Ijipt, ma mesịa laa ndị niile na-ekweghị ekwe nʼiyi. 6Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. 7Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. 17Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwuru na ha ga-emezu. 18Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. 19Ọ bụ ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ nʼime ha, bụ ndị na-eweta nkewa nʼetiti unu.” 20Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, nọgidenụ na-ewuli onwe unu elu na ntọala okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ. Na-ekpekwanụ ekpere nʼime Mmụọ Nsọ. 21Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi. 22Gosinụ ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ebere. 23Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị. 24Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ ichebe unu, ka unu ghara ịda, onye pụrụ ịkpọbata unu nʼihu ya dị ebube nʼọnọdụ enweghị ntụpọ ọbụla nʼoke ọṅụ 25ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Jọn 21:15–25

15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” 16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” 17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.” 20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.

Akwụkwọ ozi

2Kọ 5:1–10

1Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe. 2Ugbu a anyị nọ na-asụ ude, na-enwe agụụ inweta ebe obibi anyị dị nʼeluigwe. 3Ka ọ ga-abụ anyị yiri ya, ka anyị hapụ ịdị ka ndị gba ọtọ. 4Mgbe ahụ niile anyị nọ nʼime ụlọ ikwu a, anyị na-anọgide nʼịsụ ude nke ibu arọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị na-enweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nʼihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ a pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi. 5Chineke onye ya onwe ya, bụ onye kwadobere anyị maka mgbanwo nke a, nyekwara anyị Mmụọ Nsọ ka ọ bụrụ onye ga-ahụ na anyị ga-enwetazu nkwa ahụ niile. 6Nʼihi nke a, anyị nwere obi ike mgbe niile, nʼihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nʼihu na-adị ndụ nʼanụ ahụ a, anyị na Onyenwe anyị anọghị. 7Nʼihi ọ bụ okwukwe ka anyị ji adị ndụ ọ bụghị ihe anya hụrụ. 8Obi siri anyị ike. Ọ gaara amasị anyị ịhapụ ụlọ nke a anyị bi na ya, bụ ahụ anyị ma lakwuru Onyenwe anyị nʼebe obibi ya. 9Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ. 10Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Luk)

Kọl 4:5–9, 14, 18

5Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma. 6Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma. 7Taịkikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesikwara ntụkwasị obi, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nʼọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu ihe niile banyere m. 8Ana m ezitere unu ya, ka unu mara ihe banyere ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa obi unu ume. 9Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesiri ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nʼime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme nʼebe a. 14Ezi enyi anyị Luk, onye dibịa ukwu anyị na Dimas na-ekele unu. 18Eji m aka m dee ekele nke a mụ onwe m bụ Pọl. Unu echefula na m nọ nʼagbụ. Ka amara dịnyere unu.

Oziọma

Luk 6:1–10

1Nʼotu ụbọchị izuike, mgbe Jisọs na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọrọ ụfọdụ nʼime ogbe ọka ndị ahụ, na-amazu ha nʼaka, ma na-ata ha. 2Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike?” 3Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya? 4Otu o si banye nʼụlọ Chineke, were achịcha a na-eche nʼihu ya, nyetụkwa ndị ya na ha so, achịcha nke onye ọbụla na-ekwesighị ịta ma ọ bụghị naanị ndị nchụaja.” 5Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izuike.” 6Nʼụbọchị izuike ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwoke nọkwa nʼebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 7Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike. 8Ma ebe ọ maara ihe ha na-ezube nʼobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Bilie bịa guzoro nʼetiti ebe a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe ahụ. 9Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, “Ka m jụọ unu, gịnị ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike; ọ bụ ime ihe ọma ka ọ bụ ime ihe ọjọọ; ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” 10Mgbe o lesiri ha niile anya gburugburu, ọ sịrị ya, “Setịpụ aka gị.” O mere nke a, aka ya dịkwara mma ọzọ.

Oziọma (maka Onye nsọ Luk)

Luk 10:16–21

16“Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.” 17Iri mmadụ asaa na abụọ ahụ jiri ọṅụ lọta sị, “Onyenwe anyị, nʼaha gị, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi.” 18Ọ sịrị ha, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nʼeluigwe daa dị ka amụma. 19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.” 21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 31 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike