Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 31 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 31 Ọktoba 2026

Satọdee · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Fil 1:18–26

18Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ. E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile. 19Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta. 20Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ. 21Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru. 22Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ. 23Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma. 24Ma ọ pụtara ihe na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ nʼanụ ahụ. 25Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe. 26Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 42:1–2, 4

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora. Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke. 2Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke? 4Ihe ndị a ka m na-echeta mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m: ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga, mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi, na-aga nʼụlọ Chineke.

Oziọma

Luk 14:1, 7–11

1Otu ụbọchị izuike, mgbe ọ gara iri ihe nʼụlọ otu onyendu ndị Farisii, ha nọ na-ele ya anya nke ọma. 7Mgbe ọ hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri si họrọ naanị oche ndị a na-asọpụrụ, oche ndị a na-asọpụrụ, ọ tụrụ ha ilu sị, 8“Mgbe mmadụ ọbụla kpọrọ gị oriri nʼọlụlụ di na nwunye, abatala nọdụ nʼoche ndị a na-asọpụrụ, nʼihi na eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ka gị nwe nsọpụrụ. 9Nʼihi na onye ahụ kpọrọ unu oriri nwere ike bịakwute gị sị gị, nye nwoke a ọnọdụ gị. Mgbe ahụ, ị ga-ebili nʼanya ihere gaa nọdụ nʼoche dịkarịsịrị ala. 10Ma mgbe a kpọrọ gị, nọdụ nʼoche dị ala, ka ọ ga-abụ na onye kpọrọ gị oriri bịa, ọ ga-asị gị ‘Enyi m, rigota nʼebe a ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwekwa ugwu nʼanya ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri. 11Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike