Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 30 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 17 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Ọktoba 2026

Fraịdee · Izu nke 22 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Holy Prophet Hosea († 820 BC)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Kọl 4:10–18

10Arịstakọs, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ, na-ekele unu. Mak nwanne Banabas na-ekelekwa unu. (Onye unu natara ihe ntụziaka banyere ya, ọ bụrụ na ọ bịarute nʼebe unu nọ, unu nabata ya nke ọma.) 11Jisọs, onye a na-akpọkwa Jọstus, na-ekelekwa unu. Ọ bụ naanị ndị a bụ ndị Juu mụ na ha na-arụkọ ọrụ alaeze Chineke nʼebe a. Ha na-eme nnọọ nke ọma, na-enye m obi ụtọ. 12Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nʼime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge niile ka ọ na-ekpe ekpere nʼihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike bụrụ ndị tozuru etozu na ndị kwesiri ike nʼọchịchọ niile nke Chineke. 13Ana m agbara ya akaebe na ọ rụsịrị ọrụ ike nʼihi unu na nʼihi ndị Laodisia na ndị Hierapolis. 14Ezi enyi anyị Luk, onye dibịa ukwu anyị na Dimas na-ekele unu. 15Keleerenụ m ụmụnna anyị bi na Laodisia na nwanna anyị Nimfas na chọọchị na-ezukọ nʼụlọ ya. 16Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ dị na Laodisia. Gụọkwanụ nʼotu mgbe ahụ akwụkwọ nke si na Laodisia bịa. 17Gwanụ Akipos ka ọ kpachapụ anya rụchaa ọrụ Onyenwe anyị nyere ya ịrụ. 18Eji m aka m dee ekele nke a mụ onwe m bụ Pọl. Unu echefula na m nọ nʼagbụ. Ka amara dịnyere unu.

Oziọma

Luk 9:12–18

12Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, “Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara.” 13Ọ zara ha sị, “Unu nye ha nri ka ha rie.” Ha zaghachiri ya sị, “Anyị nwere naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma ọ bụghị na anyị ga aga zụọra mmadụ ndị a niile nri.” 14Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.” 15Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala. 16O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ. 17Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ. 18Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 30 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike