Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 18 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Ọktoba 2026
Sọnde · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 29 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1“Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ, bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya, napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile, megheere ya ọnụ ụzọ niile nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya. 4Nʼihi Jekọb bụ ohu m, nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m, ka m ji kpọọ gị aha gị nyekwa gị aha nke nsọpụrụ, maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ. 5Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. Ọ bụ ezie na ị maghị m, ma aga m eme ka ị dịrị ike. 6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.
Abụ Ọma nzaghachi
1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile. 3Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche. 4Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa. 5Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile. 7Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike. 8Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya; werenụ onyinye bata nʼime ogige ya. 9Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya; maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile. 10Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “ Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1Akwụkwọ ozi a si nʼaka Pọl, Saịlas na Timoti. Na-abịara nzukọ dị na Tesalonaịka, ndị e jikọtara ha na Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka amara na udo dịrị unu. 2Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe niile, na-echetakwa unu nʼekpere anyị. 3Mgbe niile ka anyị na-echeta nʼekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nʼokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nʼịhụnanya, na iguzosi ike unu nke sitere nʼolileanya unu nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. 4Ụmụnna anyị, anyị maara na Chineke hụrụ unu nʼanya nke ukwuu, họpụta unu. 5Nʼihi na ọbụghị naanị nke okwu ọnụ ka oziọma anyị rutere unu, kama ọ bụkwa nʼike, na nʼime Mmụọ Nsọ nakwa mmetụta nke dị omimi. Unu maara ụdị ndụ anyị biri nʼetiti unu nʼihi unu.
Oziọma
15Mgbe ahụ ndị Farisii zukọtara na-achọ ụzọ ha ga-esi mee ka o kwuhie ọnụ ka ha site na ya jide ya. 16Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ. 17Ugbu a gwa anyị, gịnị bụ uche gị? O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?” 18Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nʼobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? 19Gosinụ m ego e ji akwụ ụgwọ ụtụ.” Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego. 20Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka e sekwasịrị onyinyo ya nʼelu ego a? Aha onye kwa dị nʼokpuru onyinyo a?” 21Ha zara sị ya, “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Luk, Onye dere Oziọma
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike