Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 17 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Ọktoba 2026
Satọdee · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: uhie
Onye nsọ Ignatiọs nke Antiọk, Bishọp na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
15Nʼihi nke a, ebe m nụrụ akụkọ banyere okwukwe unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa maka ịhụnanya unu nwere nʼebe ndị nsọ niile nọ, 16esepụghị m aka ikele ekele nʼihi unu, mgbe niile m na-echeta unu nʼekpere m niile. 17Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ, 18ka o meghee anya nke ime mmụọ unu ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nʼihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na akụ, na ihe nketa dị ebube o nwere nʼime ndị nsọ. 19Na ịdị ukwuu nke ike ya nke na-enweghị atụ dịrị anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ịrụsị ọrụ ike nke ike ya si dị. 20Nke ọ rụrụ nʼime Kraịst mgbe o si nʼọnwụ kpọlite ya mee ya ka ọ nọdụ nʼaka nri ya nʼebe niile nke eluigwe. 21Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, ọ bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa. 22O mere ka ihe niile dị nʼokpuru ya, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe niile nye nzukọ ya bụ chọọchị. 23Nke bụ ahụ ya, ozuzu oke nke onye ahụ na-emejupụta ihe niile nʼụzọ niile.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit. O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe. 2Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ. 3Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha, 4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha? 5I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. 6I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.
Oziọma
8“Ma asị m unu, na onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, onye ahụ ka Nwa nke Mmadụ ga-ekwupụta nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke. 9Onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, a ga-agọnarịkwa ya nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke. 10Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya. 11“Mgbe ha ga-akpọbata unu nʼihu ụlọ nzukọ, ndị ọchịchị na ndịisi, unu echegbula onwe unu otu unu ga-esi zaghachi, maọbụ ihe unu ga-aza, maọbụ ihe unu ga-ekwu. 12Nʼihi na Mmụọ Nsọ ga-ezi unu nʼoge awa ahụ, ihe unu kwesiri ikwu.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Ignatiọs nke Antiọk, Bishọp na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike