Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 19 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Ọktoba 2026
Mọnde · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 29 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Pọl nke Obe, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Ndị nsọ Jọn de Brébeuf na Aịzik Jogues, Ndị ụkọchukwu, na ndị otu ha, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ma unu onwe unu, unu nwụrụ anwụ site na njehie ụzọ na mmehie unu. 2Nke unu biri ndụ nʼime ha mgbe unu na-agbaso ụzọ niile nke ụwa a, na ụzọ onye ọchịchị nke alaeze ikuku, bụ mmụọ ahụ na-arụ ọrụ ugbu a na ndụ ndị ahụ na-enupu isi. 3Anyị niile bikwara ndụ anyị nʼetiti ha, nʼoge gara aga, na-emejupụta agụụ nke anụ ahụ mmehie, ma na-agbaso ọchịchọ ya na ebumnuche ya. Nʼihi na site nʼọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nʼọmụma ikpe ya. 4Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ, 5mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu. 6Ọ kpọlitere anyị na ya, mee ka anyị nọdụ ọdụ nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst Jisọs. 7O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs. 8Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke. 9O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi. 10Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile. 2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya 3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. 4Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya. 5Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
Oziọma
13Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke nʼihe nketa anyị.” 14Ọ sịrị ya, “Nwoke, onye mere m onye ikpe maọbụ onye ndozi okwu nʼetiti unu?” 15Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.” 16Ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu ọgaranya nwere ala mịrị nnọọ mkpụrụ dị ukwuu. 17O chere nʼime onwe ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme nʼihi na enweghị m ebe m ga-echekwa mkpụrụ m?’ 18“Ya mere ọ sịrị, ‘Ihe m ga-eme bụ nke a, aga m akwatu ọba m, wuo nke ka ya ukwuu, bụ ebe m ga-echekwa mkpụrụ m na ihe ndị ọzọ. 19Ya mere aga m agwa mkpụrụobi m, “I nwere ọtụtụ ezi ihe ga-ezuru gị ọtụtụ afọ, nʼihi ya zuru ike, rie, ṅụọ ma nweekwa obi ụtọ.” ’ 20“Ma Chineke gwara ya sị, ‘Onye nzuzu, nʼabalị a ka a ga-achọ mkpụrụobi gị nʼaka gị. Ihe niile ị kpakọtara nke onye ka ha ga-abụ?’ 21“Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma ọ baghị ụba nʼebe Chineke nọ.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Pọl nke Obe, Onye ụkọchukwu
- Ndị nsọ Jọn de Brébeuf na Aịzik Jogues, Ndị ụkọchukwu, na ndị otu ha, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike