Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 18 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 5 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Ọktoba 2026
Sọnde · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 20 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 9
19Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” 20Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị. 21Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” 22Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. 23Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.” 24Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. 25Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.” 26Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 27Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.” 28Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!” 29Ma Jisọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.” 30Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a. 31Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na ọ bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.
Akwụkwọ ozi
11Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya. 12Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m. 13Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya. 14Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha. 15Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya, 16ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya. 17Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs. 18Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise. 19Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị.
Oziọma
31Dịka unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu, sitekwanụ otu a na-emeso ha. 32“Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ọbụladị ndị mmehie, ọ bụ ndị hụrụ ha nʼanya ka ha na-ahụkwa nʼanya. 33Ọ bụrụkwa naanị ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka. 34Ọ bụrụkwa na unu agbazinye naanị ndị nwere ike ịkwụghachi unu ihe, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmehie ibe ha na-atụ anya ka a kwụghachikwa ha nʼozuzu oke. 35Hụnụ ndị iro unu nʼanya, na-emekwa ezi ihe nye ha, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Mgbe ahụ, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ nke Onye kachasị ihe niile elu, nʼihi na ebere ya na-adịrị ndị ajọ omume na ndị na-enweghị mmụọ ekele nʼime ha. 36Nweenu obi ebere dị ka Nna unu si nwee obi ebere.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 18 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike