Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 4 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Ọktoba 2026
Sọnde · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 27 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya, abụ banyere ubi vaịnị ya. Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala. 2O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya, werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya. O wuru ụlọ nche nʼetiti ya, sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya. Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi. Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị. 3“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere. Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m. 4Olee ihe ọzọ m gaara emere ya karịa ihe m mere? Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ? 5Ugbu a, lee, ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a. Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya, hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri. Aga m etida mgbidi ya hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ. 6Agaghị m akwachakwa ya ọzọ. Agakwaghị m egwuru ya ala, aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya. Aga m enyekwa igwe ojii iwu ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.” 7Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ mba Izrel na ndị Juda, ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ. Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara. O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu.
Abụ Ọma nzaghachi
8I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị; ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya. 11Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri wasaakwa ume ya ruo osimiri. 12Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya? 13Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya, ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri. 14Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a, 15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị. 18Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị. 19Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike zọpụta anyị.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke. 7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs. 8Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya. 9Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.
Oziọma
33“Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ. 34Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ. 35“Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume. 36Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ. 37Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’ 38“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’ 39Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ. 40“Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?” 41Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.” 42Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’ 43“Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịpụta ezi mkpụrụ.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Fransis nke Assisi
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike