Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 5 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Ọktoba 2026
Mọnde · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Faustina Kowalska, Nwaagbọghọ · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
6O juru m anya, na unu esitela nʼebe onye ahụ kpọrọ unu site nʼamara Kraịst wezuga onwe unu, na-agbaso oziọma ọzọ, 7nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke Kraịst. 8A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ. 9Dị ka anyị buru ụzọ kwuo ya na mbụ, ka m kwuokwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-ekwusara unu oziọma dị iche na nke ahụ unu nabatara, ka onye ahụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. 10Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst. 11Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya. 12Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu. 2Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha. 7Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi; ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi. 8E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi, ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi. 9O wetaara ndị ya mgbapụta; o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi, aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu. 10Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe; ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta. Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
25Otu ụbọchị, otu onye ozizi iwu biliri ịnwale ya. Ọ jụrụ ya, “Onye ozizi, gịnị ka m kwesiri ime ka m keta ndụ ebighị ebi?” 26Ọ sịrị ya, “Gịnị ka e dere nʼiwu? Gịnị ka ị gụtara nʼime ya?” 27Ọ zara sị, “ ‘Ị ga-eji obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya’; ma ‘hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’” 28Ọ sịrị ya, “Ị zara nke ọma. Gaa mee nke a ị ga-adị ndụ.” 29Ma iji gosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ sịrị Jisọs, “Onye kwanụ bụ onye agbataobi m?” 30Jisọs sịrị ya, “Otu nwoke sitere Jerusalem na-aga Jeriko, ọ dabara nʼaka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe, hapụ ya nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma laa. 31Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja sitere ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ ya, o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafee. 32Otu a kwa, otu onye Livayị bịarutekwara nʼebe ahụ, hụ ya, ma o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafeekwa. 33Ma otu onye Sameria na-aga njem, mgbe ọ bịarutere nso nʼebe ahụ; hụ ya, o nwere ọmịiko nʼahụ ya. 34Ọ gara nso nʼebe ọ nọ, jiri mmanya na mmanụ wụsa nʼọnya ya, were akwa kechie ya. Ọ tụkwasịrị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buba ya nʼụlọ ndị ije ebe o lekọtara ya anya nke ọma. 35Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.’ 36“Onye nʼime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbataobi nye nwoke ahụ nke dabara nʼaka ndị ohi?” 37Ọ sịrị, “Ọ bụ onye ahụ meere ya ebere.” Jisọs sịrị ya, “Laa, gaa mee otu ahụ.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Faustina Kowalska, Nwaagbọghọ
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike