Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 4 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 21 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Ọktoba 2026
Sọnde · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 18 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Sọnde mgbe Mbuli elu nke Obe gasịrị
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 7
1Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ. 2O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!” 3Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ. 4Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ. 5O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime. 6Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, 7ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ. 8Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa. 9(Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.) 10Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha.
Akwụkwọ ozi (maka Sọnde mgbe Mbuli elu nke Obe gasịrị)
16ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu. 17Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba! 18Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu. 19Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe. 20Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.
Akwụkwọ ozi
6Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne. 7Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya. 8Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma. 9Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” 10Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba. 11Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.
Oziọma (maka Sọnde mgbe Mbuli elu nke Obe gasịrị)
34Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ. 35Nʼihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nʼihi m, na nʼihi oziọma m, ga-azọpụta ya. 36Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, iritecha ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ha? 37Ọ dị ihe ọzọ dị nʼụwa mmadụ nwere ike iji gbanwere ndụ ya? 38Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọbụla nʼihi m na nʼihi okwu m nʼụwa ọjọọ a, na nʼụwa mmehie a, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke Mmadụ, mgbe ọ ga-abịaghachi nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.” 9:1Ma ọ gwara ha sị, “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a, agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke mgbe ọ ga-abịa nʼike.”
Oziọma
23“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji. 24Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri. 25Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji. 26“Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị.’ 27Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ. 28“Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.’ 29“Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’ 30“Ma o kwenyeghị, kama ọ gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya. 31Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a. 32“Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ. 33Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’ 34Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji. 35“Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Septemba na kalenda nzukọ bụ 4 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike