Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 3 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Ọktoba 2026

Satọdee · Izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Job 42:1–3, 5–6, 12–17

1Mgbe ahụ, Job zara Onyenwe anyị sị: 2“Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa. 3Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata. 5Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị. 6Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.” 12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu. 13Chineke mekwara ka ọ mụta ụmụ ndị ikom asaa, na ụmụ ndị inyom atọ ọzọ. 14Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk. 15Nʼala ahụ niile, o nweghị ụmụ agbọghọ mara mma dịka ụmụ ndị inyom Job ndị a. Job mekwara ka ha bụrụ ndị ga-eso ụmụ ya ndị ikom keta oke nʼihe niile o nwere. 16Job nọgidekwara ndụ narị afọ na iri afọ anọ ọzọ. Ọ hụrụ ụmụ ya, na ụmụ ha ruo ọgbọ nke anọ. 17Job nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 119:66, 71, 75, 91, 125, 130

66Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile. 71Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile. 75O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ. 91Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi. 125Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile. 130Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.

Oziọma

Luk 10:17–24

17Iri mmadụ asaa na abụọ ahụ jiri ọṅụ lọta sị, “Onyenwe anyị, nʼaha gị, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi.” 18Ọ sịrị ha, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nʼeluigwe daa dị ka amụma. 19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.” 21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya. 22“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara onye Ọkpara ahụ bụ, karịa Nna ahụ. Ọ dịkwaghị onye maara Nna ahụ karịa Ọkpara na ndị ahụ Ọkpara chọrọ igosi onye Nna ya bụ.” 23Mgbe ahụ ọ tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzị na-adịrị anya nke na-ahụ ihe unu na-ahụ ugbu a. 24Ana m asị unu, na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike