Bible Explorer

Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Sọl na Devid

Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Sọl na Devid

Hiram wuuru Devid ụlọeze; ụmụ Devid

2Sa 5:11–16 · 1Ih 14:1–7

2 Samuel

2Sa 5:11–16

11Hiram bụ Eze Taịa, zitere Devid osisi sida e ji ewu ụlọ, na ndị ǹka osisi, ndị na-ewu ụlọ. Ha wuuru Devid ụlọeze.

12Mgbe ahụ, Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel. Bulikwa alaeze ya elu nʼihi ndị ya Izrel.

13Mgbe Devid sitere na Hebrọn kwabata na Jerusalem; ọ lụrụ ndị inyom ọzọ, nwetakwara onwe ya ọtụtụ ndị iko nwanyị. Ọ mụtakwara ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.

14Ndị a bụ aha ụmụ a mụụrụ ya na Jerusalem: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,

15Ibha, Elishua, Nefeg, Jafia,

16Elishama, Eliada na Elifelet.

1 Ihe E Mere

1Ih 14:1–7

1Hiram bụ eze Taịa zitere Devid ndị ozi, na ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-edo nkume, ka ha nyere Devid aka iwu ụlọeze ya. O nyekwara ya osisi sida o ji ewu ụlọ ahụ.

2Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel, na ebuliela alaeze ya elu nke ukwuu nʼihi ndị ya Izrel.

3Devid lụrụ ndị inyom ọzọ mgbe o jere biri na Jerusalem. Nke a mere ka ọ mụọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.

4Ndị a bụkwa aha ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,

5Ibha, Elishua, Elpelet,

6Noga, Nefeg, Jafia,

7Elishama, Beeliada na Elifelet.

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY