17Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel, ha pụrụ ka igwe ha niile ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, gbadaa nʼime ebe ahụ e wusiri ike.
18Ma ndị Filistia bịara, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim niile.
19Mgbe ahụ, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, nʼihi na aghaghị m inyefe ndị Filistia nʼaka gị.”
20Ya mere, Devid gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “ Onyenwe anyị enupula megide ndị iro m nʼihu m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal-Perazim.
21Ndị Filistia hapụrụ arụsị niile ha nʼebe ahụ. Devid na ndị ikom ya chịkọtara ha chịpụ.
22Ma ndị Filistia lọghachiri ọzọ, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim.
23Nʼihi nke a, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase, ọ zara sị, “Esitekwala nʼihu ha gaa, kama gaa gburugburu ruo nʼazụ ha, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ.
24Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mee ngwa malite ọgụ, nʼihi na nke a pụtara na Onyenwe anyị eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.”
25Devid mere dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. O tigburu ndị Filistia, site na Geba ruo Gaza.