Bible Explorer

Nyochaa › Oziọma nʼakụkụ ibe ha › Na Galili

Oziọma nʼakụkụ ibe ha · Na Galili

Jisọs mere ka oke ifufe dajụọ

Mat 8:23–27 · Mak 4:35–41 · Luk 8:22–25

Matiu

Mat 8:23–27

23Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya.

24Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme.

25Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.”

26Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii.

27O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.”

Mak

Mak 4:35–41

35Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.”

36Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya.

37Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya.

38Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?”

39Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii.

40Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?”

41Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”

Luk

Luk 8:22–25

22Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, ọ sịrị ha, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri.” Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ,

23ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu.

24Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, “Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!” O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii.

25Ọ sịrị ha, “Ebee ka okwukwe unu dị?” Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.”

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY