Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 16 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Disemba 2027

Tọọzdee · Izu nke 3 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 3 nke Advent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 54:1–10

1“Bụọ abụ, gị nwanyị aga, gị onye na-amụtaghị nwa; tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ, gị onye ime nwa na-emetụbeghị; nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 2“Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara, gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị, egbochila gbasapụ aka; mee ka ụdọ gị dị ogologo, meekwa ka o sie ike nke ọma. 3Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa; ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha, bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu. 4“Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ. Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala. Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị, na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị. 5Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya. 6Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya bụ nwunye alụtara na nwantakịrị, naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu. 7“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị 8Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m zonarị gị ihu m, ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru. 9“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ, bibie ndụ ndị dị nʼime ya, ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ. Agakwaghị m abasiri gị mba ike. 10Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile, wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha, ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ, agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,” ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 30:1, 3–5, 10–12

1Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ. Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị. 3O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. 4Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya. 5Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ. 10O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere; O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka. 11I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme. 12I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.

Oziọma

Luk 7:24–30

24Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 25Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze. 26Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma. 27Ọ bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị, “ ‘Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’ 28Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.” 29(Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim. 30Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike