Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 15 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Disemba 2027
Wenezdee · Izu nke 3 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 3 nke Advent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. 7Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị. Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi. Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile. 8“Gị, eluigwe, zodata ezi omume m ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri. Ka ala meghee onwe ya, ka nzọpụta pupụta, ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa. Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile. 18Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị, ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha. Ọ bụ ya, bụ Chineke, onye zubere ma kee ụwa, tọkwaa ntọala ya. O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu, kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya. Ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. 21Kwupụtanụ ihe kwesiri ịdị, gosinụ ya, ka ha gbaakọkwa izu. Onye buru ụzọ kwuo ihe ndị a nʼoge gara aga, onye kwupụtara ya site na mgbe ochie? Ọ bụghị mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị? Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị mụ onwe m, Chineke onye ezi omume na Onye nzọpụta; ọ dịghị onye ọzọ dị ma ewezuga m. 22“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu. Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa. Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị. 23Ejirila m onwe m ṅụọ iyi, ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume, bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe: Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala; mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi. 24E, ha ga-ekwupụta sị, ‘Ọ bụ nʼime Onyenwe anyị naanị ka ezi omume na ike dị.’ ” Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya. Ihere ga-emekwa ha. 25Ma agbụrụ niile nke Izrel ga-achọta nnapụta ha nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa na ya ka ha ga-anya isi.
Abụ Ọma nzaghachi
8Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu. 9Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị. 10Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ. 11Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya. 12Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya. 13Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.
Oziọma
19zie ha ka ha jekwuru Onyenwe anyị jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa. Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?” 20Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị jụọ gị sị, ‘Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?’ ” 21Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ. 22Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma. 23Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike