Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 16 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 3 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Disemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 26 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Prophet Sophonius († 635-605 BC)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi ma bụrụkwa eziokwu, bụ nke na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ọnọdụ ịbụ ụkọchukwu, ọ na-achọ ezi ọrụ kacha mma. 2Ya mere onye ụkọchukwu kwesiri ịbụ onye a na-adịghị ata ụta, onye lụrụ otu nwunye, onye obi umeala, onye na-achịkọta onwe ya nke ọma, onye nwere nsọpụrụ, onye na-anabata ndị ọbịa nʼụlọ ya, nakwa onye nwere ike ikuzi ihe. 3Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, ọ gaghị abụ onye na-alụkarị ọgụ, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ, onye na-ahụghị okwu na ụka nʼanya, na onye na-adịghị ahụ ego nʼanya. 4Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinaụlọ ya nke ọma, bụrụkwa onye na-achịkwa ụmụ ya inwe nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla. 5(Nʼihi na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike chịkọtazie ezinaụlọ ya, ọ ga-esi aṅaa chịzie chọọchị Chineke?) 6Ọ gaghị abụ onye chegharịrị ọhụrụ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-afụlị onwe ya elu nʼịnya isi, ma si otu a daba nʼọmụma ikpe dị ka ekwensu. 7Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu. 8Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị na-enweghị ire abụọ, ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị akpịrị ego na-agbaso uru nʼezighị ezi. 9Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike. 10Tupu a họpụta ha ịrụ ọrụ a, a ga-ebu ụzọ nwalee ha. Ọ bụrụ na ha enweghị ebubo ọbụla megide ha, mgbe ahụ, a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị. 11Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile. 12Ndị niile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere naanị otu nwunye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinaụlọ nke aka ha nke ọma. 13Nʼihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkwuwa okwu ha nwere banyere okwukwe a nʼime Kraịst Jisọs.
Oziọma
9Ọ gara nʼihu tụọrọ ndị mmadụ ilu a sị, “Otu nwoke nwere ubi vaịnị, nke o nyefere nʼaka ndị ga-elekọta ya anya ma pụọ gaa njem nʼala ọzọ ebe ọ nọrọ ogologo oge. 10Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zigara otu nʼime ndị ohu ya ka ọ bịakwute ndị ahụ na-elekọtara ya ubi, ka ha nyekwa ya ụfọdụ nʼime mkpụrụ ubi vaịnị ahụ. Ma ndị na-elekọtara ya ubi jidere ya, tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu. 11O zigakwara ohu ya ọzọ. Ma ha tikwara ya ihe mee ya ihe ihere, zilakwaa ya nʼaka efu. 12O zigakwara onye nke atọ, ma ha merụrụ ya ahụ, chụlaa ya. 13“Mgbe ahụ, onyenwe ubi vaịnị ahụ sịrị, ‘Gịnị ka m ga-eme? Aga m ezigara ha ọkpara m, nke m hụrụ nʼanya, ma eleghị anya ha ga-asọpụrụ ya.’ 14“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ya, ha kwurịtara nʼetiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a, ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’ 15Ya mere, ha kpụfere ya nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya. “Gịnị ka onye nwe ubi ahụ ga-eme ha? 16Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.” Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.” 17O legidere ha anya sị, “Gịnịkwa ka unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ pụtara, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ aghọọla nkume nke isi ntọala ụlọ’? 18Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume ahụ, ka a ga-etiwasị, ma onye ọbụla ọ dakwasịrị, ka ọ ga-egwepịa.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Disemba na kalenda nzukọ bụ 16 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike