Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 3 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Disemba 2027

Fraịdee · Izu nke 1 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 1 nke Advent

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Fransis Zavier, Onye ụkọchukwu · Ncheta

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 29:17–24

17Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe, ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa? 18Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ, ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha, hụkwa ụzọ ọzọ. 19Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye. 20Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa; ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa, ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha, 21bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara, ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya, ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka. 22Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb, “Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ. Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ. 23Mgbe ha hụrụ ụmụ ha, bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha, ha ga-edo aha m nsọ, ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb, ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji. 24Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta, ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 27:1, 4, 13–14

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. 13Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ. 14Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.

Oziọma

Mat 9:27–31

27Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ebere!” 28Ha sooro ya bata nʼụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kwere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “E, Onyenwe anyị, anyị kweere.” 29O metụrụ ha aka nʼanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.” 30Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha “Unu agwakwala onye ọbụla.” 31Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe niile nʼala ahụ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike