Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 3 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 20 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Disemba 2027
Fraịdee · Izu nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Forefeast of the Entry of the Theotokos
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
9Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. 10Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ. 11Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme. 12Anyị na-arịọsị unu ike, ụmụnna, ka unu na-asọpụrụ ndị niile na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼihi unu, ndị ahụ na-elekọta unu nʼime ọrụ Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adụ unu ọdụ. 13Ka unu na-akwanyere ha ugwu site nʼịhụnanya nʼihi ụdị ọrụ ha na-arụ. Ka unu na mmadụ ibe unu birikwa nʼudo. 24Onye ahụ kpọrọ unu ga-emezu ihe ndị a, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. 25Biko ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere. 26Werenụ isurita ọnụ dị nsọ na-ekele ụmụnna anyị dum. 27Iwu m na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị bụ ka unu gụpụta akwụkwọ a nʼihu ụmụnna niile. 28Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu niile.
Akwụkwọ ozi (maka Satọdee)
1Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-anagide m ka m kwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nagidenụ m. 2Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke. 3Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi. 4Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara. 5Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọbụla ndị ozi a maara aha ha si kara m mma. 6Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile.
Oziọma
15Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke. 16“Iwu na ndị amụma nọ na-achị ruo oge Jọn bịara. Site nʼoge ahụ, a na-ekwusa oziọma nke alaeze Chineke, onye ọbụla na-ejikwa ike na-abanye nʼime ya. 17Ọ dị mfe ka eluigwe na ụwa gabiga karịa na a ga-ewepụ otu kpọm, site nʼihe niile dị nʼiwu. 18“Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụlakwa lụrụ nwanyị di ya jụrụ na-eme mmehie ịkwa iko. 17:1Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa. 2Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ. 3Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. 4Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.”
Oziọma (maka Satọdee)
57Mgbe ha nọ na-aga ije a, otu nwoke sịrị ya, “Aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.” 58Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ, ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe ọ na-atụkwasị isi.” 59Ọ gwara onye ọzọ sị, “Soro m.” Ma ọ sịrị ya. Onyenwe anyị, “Biko, nye m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m.” 60Ma ọ sịrị ya, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha. Ma gị gaa kwusaa alaeze nke Chineke.” 61Ma onye ọzọkwa, sịrị ya, “Aga m eso gị, Onyenwe m, ma kwere ka m buru ụzọ gaa sị ndị ezinaụlọ m nọdụnụ nke ọma.” 62Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla jidere aka nʼọgụ anụ ụlọ na-adọkpụ ma na-ele anya nʼazụ ekwesighị alaeze Chineke.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Novemba na kalenda nzukọ bụ 3 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike