Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 2 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Disemba 2027

Tọọzdee · Izu nke 1 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 1 nke Advent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 26:1–6

1Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile: Anyị nwere obodo e wusiri ike. Chineke na-eme ka mgbidi ya na ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị. 2Meghee ụzọ ama niile, ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata, e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi. 3Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike nwee udo zuruoke, nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha. 4Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi. 5Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala, na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala. Mgbidi ya ka ọ na-eme ka ọ daruo ala. 6Ọ na-enyefe obodo ahụ nʼaka ndị a na-emegbu emegbu, na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 118:1, 8–9, 19–21, 25–27

1Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 8Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi. 9Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi. 19Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele. 20Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye. 21Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m. 25O Onyenwe anyị, zọpụta anyị; o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma. 26Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị. 27Onyenwe anyị bụ Chineke, ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị. Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke bịaruo nʼebe ịchụ aja.

Oziọma

Mat 7:21, 24–27

21“Ọ bụghị ndị niile na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-abanye nʼalaeze eluigwe, kama ọ bụ naanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nʼeluigwe na-achọ ka ha mee. 24“Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume. 25Mmiri zosikwara ike nʼelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara, tie nʼụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nʼihi na e wuru ntọala ya nʼelu oke nkume. 26Ma ndị niile nụrụ okwu ndị a, ma lefuru ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nʼelu aja. 27Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala. Ọdịda ya dị ukwuu.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike