Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 4 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Disemba 2027
Satọdee · Izu nke 1 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 1 nke Advent
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo
Onye nsọ Jọn nke Damaskọs, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
19Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya. 20Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha. 21Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.” 23Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara. 24Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma. 25Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada. 26Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya! 2Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem: ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ. 3Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ. 4Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu. 5Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ. 6Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.
Oziọma
35Jisọs jegharịrị nʼobodo niile na ogbe niile dị nʼebe ahụ, ma ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nʼụlọ ekpere ndị Juu, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche. 36Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ niile na-abịakwute ya, ọmịiko ha mere ya, nʼihi na ha bụ ndị a na-esogbu. Ndị na-enweghị onye inyeaka. Ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. 37Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Owuwe ihe ubi hiri nne nʼezie. Ma ndị ọrụ dị ole na ole. 38Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya.” 10:1Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche. 6Kama jekwurunụ ụmụ Izrel, ndị bụ atụrụ furu efu. 7Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’ 8Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn nke Damaskọs, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike