Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 23 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Ọktoba 2027

Satọdee · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Jọn nke Capistrano, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 8:1–11

1Ya mere, ikpe ọmụma ọbụla adịghịkwa ugbu a nye ndị niile nọ nʼime Jisọs Kraịst. 2Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ. 3Nʼihi na ihe iwu na-enweghị ike ime, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ, ka Chineke mere, site nʼizite Ọkpara ya, ka ọ bịa nʼụdịdị anụ ahụ mmehie, bụrụ aja mmehie, site otu a, maa mmehie ikpe na anụ ahụ. 4Ka izu ezu nke ihe niile iwu chọrọ nʼaka anyị bụrụ ihe e mezuru nʼime anyị, bụ ndị na-adịghị ebi ndụ dịka ọchịchọ anụ ahụ si dịrị, kama dịka ọchịchọ Mmụọ Nsọ si dị. 5Ndị niile na-ebi ndụ ha dịka anụ ahụ siri chọọ, na-ebi ya naanị imezu agụụ niile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị niile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Mmụọ na-achọ. 6Ịtụkwasị uche nʼihe nke anụ ahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasị uche nʼihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na udo. 7Nʼihi na onye ọbụla tụkwasịrị uche ya nʼihe nke anụ ahụ na-ebuso Chineke agha, ọ naghị edebe iwu nke Chineke. Nʼeziokwu, ọ gaghị enwe ike idebe ya. 8Ya mere, ndị na-erubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. 9Ma lee! Unu onwe unu anaghị ebizi ndụ nʼusoro nke anụ ahụ, kama unu na-ebi nʼusoro nke Mmụọ Nsọ nʼihi na Mmụọ nke Chineke bi nʼime unu. Onye ọbụla na-enweghị Mmụọ nke Kraịst abụghị nke ya. 10Ọ bụrụkwa na Kraịst bi nʼime unu, anụ ahụ unu ga-abụ ihe nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị, ma mmụọ unu dị ndụ nʼihi na a gụọla unu na ndị ezi omume. 11Ọ bụrụ na Mmụọ onye mere ka Jisọs si nʼọnwụ bilie, bi nʼime gị, onye ahụ nke mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ site nʼike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nʼime gị.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 24:1–6

1Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya. 2Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike. 3Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya? 4Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ. 5Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha. 6Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela

Oziọma

Luk 13:1–9

1Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ gwara ya banyere ndị Galili ahụ Pailet jiri ọbara ha gwakọta nʼaja ha chụrụ. 2Ọ zara sị ha, “Unu chere na ndị Galili a tara ụdị ahụhụ a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili niile? 3Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-esi otu ahụ laa nʼiyi. 4Ka unu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị mgbidi aja ụlọ elu Sailọm dagburu bụ ndị ikpe mmehie mara karịa ndị niile bi na Jerusalem? 5Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-ala nʼiyi dị ka ha.” 6Ya mere, ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu nwoke kụrụ osisi fiig nʼubi vaịnị ya, ma mgbe ọ bịara chọọ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla. 7Ya mere, ọ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Nʼime afọ atọ ndị a ka m bịara ka m ghọrọ mkpụrụ site nʼosisi fiig a, ma ahụghị m mkpụrụ ọbụla. Gbutuo ya! Gịnị mere ọ ga-eji na-erikọ nri dị nʼala ubi a?’ 8“Ọ zara sị ya, ‘Nna m ukwu, hapụkwa ya nʼafọ a, ka m gwuo ala gburugburu, hinye ya aja nri ala nʼukwu. 9Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ nʼafọ ọzọ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị, i nwere ike gbutuo ya. ’ ”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike