Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 25 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Ọktoba 2027
Mọnde · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
12Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ ma ọ bụghị anụ ahụ ka anyị ji ụgwọ ịdị ndụ dịka ọchịchọ ya si dị. 13Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ. 14Nʼihi na ndị niile Mmụọ nke Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke. 15Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba, Nna.” 16Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke. 17Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga. 3Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ, ma ṅụrịa nʼihu Chineke; ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ. 5Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha, onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ. 6Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ, ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ. 19Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị, Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela 20Chineke anyị bụ Chineke na-azọpụta; mgbapụta pụọ nʼọnwụ na-esite nʼaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
Oziọma
10Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe. 11Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem. 12Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.” 13Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke. 14Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.” 15Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike? 16O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?” 17Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile ọ na-arụ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike