Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 22 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Ọktoba 2027
Fraịdee · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 29 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Jọn Pọl nke Abụọ, Pope · Ncheta a na-ahọrọ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
18O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m. 19Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme. 20Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha. 21Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime. 22Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru. 23Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m. 24Lee ụdị ọnọdụ ọjọọ nke m hụtara onwe m nʼime ya! Onye pụrụ ịnapụta m site nʼanụ ahụ a nke na-eduba m nʼọnwụ? 25Ma ekele dịrị Chineke, onye na-anapụta m site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ya mere, nʼime mmụọ m, abụ m odibo nye iwu Chineke, ma nʼime anụ ahụ mmehie m, abụ m ohu nye iwu nke mmehie.
Abụ Ọma nzaghachi
66Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile. 68I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile. 76Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị. 77Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m. 93Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m. 94Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
Oziọma
54Ọ gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe unu hụrụ urukpu ojii ka ọ na-ebili nʼọdịda anyanwụ, unu na-eme ngwangwa sị, ‘Mmiri ga-ezo,’ ọ na-ezokwa. 55Mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, Oke okpomọkụ ga-adị, ọ na-emekwa otu ahụ. 56Ndị ihu abụọ! Unu matara ịkọwa ihu ala na mbara eluigwe. Gịnị mere unu apụghị ịkọwa oge dị ugbu a? 57“Gịnị mere unu adịghị ekpebiri onwe unu ihe ziri ezi? 58Ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nʼihu ọkaikpe, gbalịsie ike ka gị na ya kpezie nʼụzọ, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-akpọpụ gị nʼihu onye ọkaikpe, ma eleghị anya ọkaikpe ahụ ga-arara gị nye nʼaka ọkaikpe ukwu, ọkaikpe ukwu ga-ararakwa gị nye nʼaka onye na-eje ozi nʼụlọikpe, bụ onye ga-etinye gị nʼụlọ mkpọrọ. 59Asị m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri ọ bụladị otu kobo nke ikpeazụ.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn Pọl nke Abụọ, Pope
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike