Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 19 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 6 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Ọktoba 2027

Tiuzdee · Izu nke 18 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Holy and Glorious Apostle Thomas (1st C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi (maka Onyeozi Tọmọs)

1Kọ 4:9–16

9Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. 10Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ. 11Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị. 12Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi. 13Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa. 14Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya. 15Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu. 16Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m.

Oziọma

Luk 6:37–45

37“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Unu amala ndị ọzọ ikpe ka a ghara ịma unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu. 38Nyenụ, nʼihi na a ga-enyekwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ nke juru eju, nke a bịadara nke ọma, yọkọtakwa ayọkọta nke na-ejubiga oke ka a ga-adọkwasị gị nʼahụ; nʼihi na ọ bụ ihe i na-eji atụ ihe ka a ga-eji tụọrọ gị.” 39Ọ tụkwaara ha ilu a, “Onye ìsì ọ pụrụ idu onye ìsì ibe ya? Ha abụọ ọ gaghị adaba nʼime olulu? 40Onye na-eso ụzọ onye ozizi anaghị akarị onye nkuzi ya, kama mgbe ọ mụtasịrị ọ ga-amata ihe dị ka onye nkuzi ya. 41“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya, ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya? 42Ị ga-esi aṅaa sị nwanna gị, ‘Nwanna a, ka m wepụ gị ntakịrị ahịhịa dị gị nʼanya,’ mgbe gị onwe gị na-ahụghị obodobo osisi dị gị nʼanya? Gị onye ihu abụọ, buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ nke ọma wepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya. 43“Ezi osisi adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọ dịkwaghị osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọma. 44Ọ bụ mkpụrụ osisi mịrị ka e ji ama ụdị osisi ọ bụ. Ndị mmadụ adịghị aghọta fiig site nʼosisi ogwu, otu a kwa o nweghị onye na-aghọta mkpụrụ grepu nʼobi ogwu. 45Ezi mmadụ na-esite nʼakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ọrụ, otu a kwa, ajọ mmadụ na-esite nʼobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ọrụ. Nʼihi na ihe ọbụla dị mmadụ nʼobi bụ ihe na-apụta nʼọnụ ya.

Akwụkwọ ozi

Efe 5:20–26

20Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 21Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst. 22Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị. 23Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya. 24Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile. 25Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya. 26O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha.

Oziọma (maka Onyeozi Tọmọs)

Jọn 20:19–31

19Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” 20Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị. 21Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” 22Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. 23Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.” 24Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. 25Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.” 26Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 27Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.” 28Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!” 29Ma Jisọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.” 30Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a. 31Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na ọ bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 19 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike