Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 19 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Ọktoba 2027

Tiuzdee · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Pọl nke Obe, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ

Ndị nsọ Jọn de Brébeuf na Aịzik Jogues, Ndị ụkọchukwu, na ndị otu ha, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 5:12, 15, 17–21

12Dịka o siri dị, ọ bụ site nʼaka otu nwoke ka mmehie siri bata nʼụwa. Ọ bụkwa mmehie a wetara ọnwụ. Ugbu a, ọnwụ erutela onye ọbụla aka nʼihi na mmadụ niile emehiela. 15Ma onyinye a adịghị ka njehie ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ọtụtụ nwụrụ site na mmehie nke otu mmadụ, lee ka o siri bụrụ ihe dị ukwu karịa na amara Chineke na onyinye amara sitere nʼotu onye bụ Jisọs Kraịst ga-ababiga ụba oke rute ọtụtụ mmadụ. 17Ya mere, ọ bụrụ na ọnwụ chịrị ọchịchị site na njehie nke otu onye, ọ bụghị ihe dị ukwu karịa na ndị nabatara onyinye amara Chineke bara ụba, ya na onyinye ezi omume, ga-achị achị na ndụ site nʼotu onye ahụ bụ Jisọs Kraịst. 18Ya mere, dịka otu njehie si weta ikpe ọmụma nye mmadụ niile, otu ahụ kwa ka e si gụọ mmadụ niile dịka ndị ezi omume na ndị nwere ndụ site nʼotu ọrụ ezi omume. 19Nʼihi na dịka ọtụtụ mmadụ si bụrụ ndị mmehie nʼihi nnupu isi nke otu nwoke, otu a kwa ka ọtụtụ mmadụ ga-abụkwa ndị ezi omume nʼihi nrube isi nke otu nwoke. 20Iwu bịara mee ka mmehie na-aba ụba, ma dịka mmehie na-aba ụba, amara na-abakwa ụba karịa. 21Ya mere, dịka mmehie si bụrụ eze nʼọnwụ, otu a kwa ka amara ga-esi bụrụ eze site nʼezi omume iweta ndụ ebighị ebi site nʼaka Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 40:6–9, 16

6Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. 7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. 8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.” 9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o Onyenwe anyị, anaghị m emechi ọnụ m. 16Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “ Onyenwe anyị dị ukwuu.”

Oziọma

Luk 12:35–38

35“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu. 36Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka. 37Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi. 38Ngọzị ga-adịrị ndị ohu ahụ onye nwe ha ga-ahụ ka ha nọ na njikere, ọ bụladị ma ọ lọghachiri nʼetiti abalị, maọbụ nʼezigbo isi ụtụtụ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike