Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 18 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 5 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Ọktoba 2027

Mọnde · Izu nke 18 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Martyr Charitina of Amisus († 304)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Efe 4:25–32

25Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ. 26Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe. 27Enyela ekwensu ohere. 28Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. 29Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị. 30Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta. 31Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu. 32Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.

Oziọma

Luk 6:24–30

24“Ma ahụhụ na-adịrị unu ndị ọgaranya, nʼihi na unu eketala nkasiobi unu. 25Ahụhụ na-adịrị ndị afọ juru ugbu a, nʼihi na agụ ga-agụkwa unu. Ahụhụ na-adịrị ndị na-achị ọchị ugbu a, nʼihi na unu ga-eru ụjụ, bee akwa. 26Ahụhụ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ niile na-ekwu okwu ọma gbasara unu, nʼihi na otu a ka ndị bụ nna ha mesoro ndị amụma ụgha.” 27“Ma a na m agwa unu ndị na-ege m ntị: hụnụ ndị iro unu nʼanya, mekwaaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma. 28Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpekwaaranụ ndị na-akparị unu ekpere. 29Ọ bụrụ na onye ọbụla a maa gị ụra nʼotu ntị, tụgharịara ya ntị gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị. 30Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 18 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike