Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 20 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 7 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Ọktoba 2027

Wenezdee · Izu nke 18 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Sergius and Baccus in Syria († 290-303)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Efe 5:25–33

25Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya. 26O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha. 27Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta. 28Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya. 29Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị. 30Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya. 31“Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” 32Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya. 33Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.

Oziọma

Luk 6:46–7:1

46“Gịnị mere unu ji na-akpọ m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ma unu adịghị eme ihe m kwuru? 47Achọrọ m igosi unu ihe onye ọbụla na-abịakwute m nke na-anụ okwu m, ma na-ejikwa ihe ọ na-anụ akpọrọ ihe, yiri. 48Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ, onye gwumiri ala, doo ntọala ụlọ ahụ nʼelu oke nkume. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, o nweghị ike ime ka ọ maa jijiji nʼihi na e wusiri ya ike. 49Ma onye ahụ nụrụ okwu m, nke na-ejighị ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke wukwasịrị ụlọ ya nʼelu ala, nke na-enweghị ntọala ọbụla. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala, ọdịda ya dị ukwuu.” 7:1Mgbe o kwusiri okwu ndị a nye ndị na-ege ya ntị, ọ banyere na Kapanọm.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 20 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike