Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 9 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Ọktoba 2027
Satọdee · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Denis, Bishọp, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Onye nsọ Jọn Leonardi, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Onye nsọ Jọn Henri Newman, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
12“Ka akpọlitekwa mba niile, mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe. 13Tinye mma iwe ihe ubi, nʼihi na mkpụrụ ubi achaala. Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị, nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula, ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke, nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.” 14Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ! Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ. 15Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè. 16Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike. 17“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ. Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ. 18“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta dee Ndagwurugwu Shitim. 19Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda, bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha. 20Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile. 21Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha? Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị. Nʼihi na Onyenwe anyị bi na Zayọn.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa. 2Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya. 5Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu Onyenwe ụwa niile. 6Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya. 11Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume, ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi. 12Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume, tookwanụ aha nsọ ya.
Oziọma
27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Denis, Bishọp, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe
- Onye nsọ Jọn Leonardi, Onye ụkọchukwu
- Onye nsọ Jọn Henri Newman, Onye ụkọchukwu na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike