Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 9 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 26 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Ọktoba 2027
Satọdee · Izu nke 16 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Repose of the Holy Apostle and Evangelist John the Theologian († 98-117)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
21Ndị m hụrụ nʼanya, ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu nʼihu Chineke 22na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ. 23Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu. 24Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị. 4:1Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa. 2Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke. 3Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa. 4Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa. 5Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị. 6Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
11Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya. 12O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị. 13O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya. 14Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa. 15Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke. 16Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
20Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya. 21Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ Chineke nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.” 5:1Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya. 2Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. 3Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ. 4Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị. 5Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” 16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” 17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.” 20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Jọn)
12O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị. 13O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya. 14Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa. 15Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke. 16Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a. 17Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a. 18Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya. 19Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya.
Oziọma (maka Onye nsọ Jọn)
25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs. 26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.” 27Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya. 21:24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 26 Septemba na kalenda nzukọ bụ 9 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike