Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 8 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Ọktoba 2027

Fraịdee · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jul 1:13–15; 2:1–2

13Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ, kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja. Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị unu ndị na-ejere Chineke m ozi nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ ịbata nʼụlọ Chineke unu. 14Kpọsaanụ obubu ọnụ dị nsọ. Kpọọnụ nzukọta dị nsọ. Chịkọtaanụ ndị okenye na ndị niile bi nʼala a, ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke unu; ka ha tikuo Onyenwe anyị mkpu akwa. 15Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso. Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. 2:1Fụọ opi ịdọ aka na ntị na Zayọn. Ka a nụ ụda opi ịdọ aka na ntị site nʼelu ugwu nsọ m. Ka ndị niile bi nʼala ahụ maa jijiji, nʼihi na ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị na-abịa, ọ na-abịaru nso. 2Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu. Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị. Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ. Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu. Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ, a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 9:1–2, 5, 15, 7–8

1Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị, aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme. 2Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu. 5I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi, hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi. 15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha. 7Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi. 8Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe; jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.

Oziọma

Luk 11:15–26

15Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Ọ bụ site nʼike Belzebub eze ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” 16Ndị ọzọ, iji nwalee ya, sị ya gosi ha ihe ịrịbama nke si nʼeluigwe. 17Ma ebe ọ bụ na ọ maara ihe ha na-eche, ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla kewaranụ megide ibe ya, ga-atọgbọrọ nʼefu, ezinaụlọ ọbụla nke kewakwara megide ibe ya ga-adakpọ. 18Ọ bụrụ na ekwensu ekewa megide onwe ya, alaeze ya ọ ga-esi aṅaa guzosie ike? Unu na-asị na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub. 19Ugbu a, ọ bụrụ na m sitere nʼike Belzebub na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ site nʼike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe unu. 20Ma ọ bụrụ na m ji ike mkpịsịaka Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, mgbe ahụ alaeze Chineke abịarutela nʼebe unu nọ. 21“Mgbe nwoke siri ike ji ngwa agha chekwa obi ya, ihe o nwere ga-adịgidere ya nʼudo. 22Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka ya ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ ga-anara ya ngwa agha niile bụ ihe ntụkwasị obi ya, kesakwaa ihe ọ kwatara nʼụlọ dike ahụ. 23“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa. 24“Mgbe ọbụla mmụọ na-adịghị ọcha sị nʼime mmadụ pụọ, ọ na-ejegharị nʼala kpọrọ nkụ na-achọgharị ebe izuike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị ya, mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m hapụrụ.’ 25Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala ya dozie ya nke ọma. 26Mgbe ahụ, ọ ga-apụ ga chọta mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị dị njọ karịa ya. Ha niile na-abata biri nʼime onye ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike