Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 10 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Ọktoba 2027
Sọnde · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 28 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
12Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara. 13O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị? Meere ndị ohu gị ebere. 14Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ, ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile. 15Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ, ka ọnụọgụgụ afọ ya dịkwa ka ọnụọgụgụ afọ niile anyị hụrụla nsogbu. 16Kwere ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị dị iche iche, ka ụmụ ha hụkwa ịma mma gị. 17Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị; mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike, e, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
12Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ. 13Ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe niile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nʼebe Chineke nọ. Ihe niile ghere oghe, ma gbarakwa ọtọ nʼihu anya ya. Ọ bụ nʼihu ya ka anyị niile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị niile.
Oziọma
17Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” 18Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke. 19Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’ ” 20Ọ sịrị ya, “E, onye ozizi, Edebezuchaala m ha niile siterị na mgbe m bụ nwata.” 21Jisọs lere ya anya, hụ ya nʼanya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ọ fọdụrụ naanị otu ihe ị ga-eme. Laa, ugbu a, ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nʼeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.” 22Mgbe ọ nụrụ okwu a, ihu ya gbarụrụ. O sitere nʼebe ahụ pụọ na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya nke nwere ọtụtụ akụnụba. 23Jisọs legharịrị anya gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe rara ahụ na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze Chineke.” 24Okwu ya tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya, ma Jisọs gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị, ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ ịbanye nʼalaeze Chineke. 25Ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” 26Okwu a jubigara ha anya oke. Ha jụrịtara ibe ha sị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” 27Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.” 28Pita malitere ịgwa ya sị, “Anyị ahapụla ihe niile soro gị!” 29Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a, 30nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike