Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 1 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 18 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Ọktoba 2027
Fraịdee · Izu nke 15 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Exaltation of the Cross
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
8Nʼoge gara aga, mgbe unu na-amaghị Chineke, unu bụ ohu nye chi niile nke na-abụghị dịka ha si pụta ụwa. 9Ma ugbu a, unu matarala Chineke, ka m ga-asị na Chineke amatala ndị unu bụ, gịnị mere unu ji chọọ ịtụgharị azụ laghachi nʼokpukpe ndị ahụ na-enweghị isi, nke ike ọbụla na-adịghị nʼime ha? Unu chọrọ ka ha mee unu ndị ohu ha ọzọkwa? 10Unu na-edebe ụbọchị ụfọdụ, na ọnwa ụfọdụ, na oge ụfọdụ, na afọ ụfọdụ. 11Egwu na-atụ m na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti unu abụrụla ihe efu. 12Ezi ụmụnna m, arịọọ m unu, meenụ onwe unu dị ka mụ onwe m, nʼihi na mụ onwe m emela onwe m ka m dị ka unu. O nweghị ihe ọjọọ ọbụla unu mere m. 13Unu maara na ọ bụ nʼime adịghị ike nke anụ ahụ ka m ji kwusaara unu oziọma a. 14Ọ bụ ezie, ọnọdụ m nʼoge ahụ bụ ọnwụnwa nʼebe unu nọ, unu eledaghị m anya, maọbụ jụ ige m ntị. Kama unu nabatara m, dị ka mmụọ ozi Chineke, maọbụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya. 15Ebee ka mmụọ nke obi ụtọ ahụ unu nwere nọ? Nʼihi na m na-agba ama, na-asị na ọ bụrụ ihe a pụrụ ime, unu gaara aghụpụta anya unu nye m. 16Ugbu a, aghọọla m onye iro unu, nʼihi na m na-agwa unu eziokwu? 17Ha na-ezipụta mmasị nʼebe unu nọ, ma ọ bụghị maka ọdịmma unu. Ha chọrọ ikewapụ unu nʼebe m nọ, ka unu nwee mmasị nʼebe ha nọ. 18Maka ebumnuche dị mma, ọ dị mma inwe mmasị mgbe niile. Ọ bụghị naanị mgbe mụ na unu nọ. 19Ụmụntakịrị m, ndị m kwe maka ha nọdụ nʼọnọdụ ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ọzọ, na-eche ụbọchị ahụ a ga-eme ka ụdịdị Kraịst dị nʼime unu. 20Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nọ nʼetiti unu ugbu a, nwee ike ịmata otu m ga-esi gbanwee olu okwu m, nʼihi na-amaghị m ihe m kwesiri ime nʼihi ọnọdụ unu. 21Gwanụ m, unu ndị na-eche na ọ dị mkpa idebe iwu, unu agaghị aṅaa ntị na ihe iwu ahụ kwuru?
Oziọma
45Ngwangwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri Betsaida, ebe ya onwe ya nọdụrụ izilaga igwe mmadụ ahụ. 46Mgbe ndị a niile lachara, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere. 47Mgbe uhuruchi bịara, ụgbọ mmiri ahụ nọ nʼetiti osimiri, ma naanị ya onwe ya nọ nʼelu ala. 48Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha. 49Ma mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ, tie mkpu akwa. 50Nʼihi na ha niile hụrụ ya, oke ụjọ tụkwara ha. Na-atụfughị oge, ọ gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Ọ bụ m. Unu atụla egwu.” 51Emesịa, ọ rịgokwuru ha nʼime ụgbọ mmiri ahụ, otu mgbe ahụ ikuku ahụ dara juu. Ihe ndị a jukwara ha anya nke ukwuu. 52Obi ha mechiri emechi nʼihi na ha aghọtaghị ihe banyere ọrụ ebube ogbe achịcha ndị ahụ. 53Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha rutere nʼala Genesaret ebe ha kedoro ụgbọ ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Septemba na kalenda nzukọ bụ 1 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike