Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 2 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Ọktoba 2027

Satọdee · Izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Ndị mmụọ ozi nsọ na-eche nche · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 69:32–36

32Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ. 33Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya. 34Ka eluigwe na ụwa too ya, osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha. 35Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn; ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha. 36Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya, ndị hụrụ aha ya nʼanya ga-ebikwa ebe ahụ nʼime ya.

Oziọma

Mat 18:1–5, 10

1Nʼoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ajụjụ sị, “Olee onye dị ukwuu karịa ibe ya nʼalaeze eluigwe?” 2Ọ kpọrọ otu nwantakịrị, onye o mere ka o guzoro nʼetiti ha, 3ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe. 4Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe. 5Onye ọbụla nabatara nwantakịrị dị otu a nʼihi m, bụ onye nabatara m. 10“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike